Abụ Ọma 92
Abụ Ọma. Abụ maka ụbọchị izuike. 
Ekele maka ịdị mma Chineke 
 1 Ọ bụ ihe ziri ezi ito Onyenwe anyị, 
na iti egwu nye aha gị, gị Onye kachasị ihe niile elu, 
 2 ikwupụta ịhụnanya gị nʼụtụtụ, 
na ikwesi ntụkwasị obi gị nʼabalị, 
 3 jiri ihe iti egwu ụbọ akwara 
na une bụọrọ gị abụ dị ụtọ. 
 4 Nʼihi na ị na-eme ka obi dị m ụtọ, site nʼọrụ gị niile, o Onyenwe anyị, 
Ọ bụ ya mere m ji na-abụ abụ ọṅụ. 
 5 Lee ka ọrụ gị si dị ukwuu, Onyenwe anyị. 
Leekwa ụdị echiche miri emi ị na-eche. 
 6 Ndị uche kọrọ amaghị nke a, 
ndị nzuzu enweghị nghọta, 
 7 ọ bụ ezie na ndị ajọ omume na-etopụta dịka ahịhịa 
ndị na-emekwa ajọ ihe na-eto na-awasa, 
a ga-ala ha nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi. 
 8 Ma gị, O Onyenwe anyị, bụ onye e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi. 
 9 Nʼezie, ndị iro gị niile, Onyenwe anyị, 
e ndị iro gị niile ga-ala nʼiyi; 
ndị niile na-eme ajọ ihe ka a ga-achụsasị. 
 10 I meela ka mpi m dị elu dịka oke ehi na-akpa ike; 
awụsala m mmanụ dị mma. 
 11 Ejirila m anya m abụọ hụ ka e meriri ndị iro m; 
ejirila m ntị m nụ maka ịla nʼiyi nke ndị iro m afọ tara mmiri. 
 12 Ma ndị ezi omume ga-awa igu dịka osisi nkwụ; 
ha ga-ebukwa ibu dịka osisi ukwu sida nke Lebanọn, 
 13 nke a kụrụ nʼime ụlọ Onyenwe anyị, 
ha ga-eto, wasaakwa nʼime ogige Chineke anyị. 
 14 Ha ga-amị mkpụrụ, ọ bụladị mgbe ha mere agadi. 
Ha ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ, 
 15 na-ekwupụta, “Onyenwe anyị bụ Onye ziri ezi; 
ọ bụ Oke Nkume m, ọ dịkwaghị ajọ omume dị nʼime ya.”