Abụ Ọma 57
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala” Devid. Abụ miktam. Mgbe ọ gbapụrụ ga biri nʼime ọgba nkume nʼihi Sọl. 
Ntụkwasị obi nʼime Chineke 
 1 Meere m ebere, O Chineke, meere m ebere, 
nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba. 
Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba 
tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa. 
 2 Aga m akpọku Chineke nke kachasị ihe niile elu, 
Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa. 
 3 Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m 
na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; 
Sela
 Chineke na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. 
 4 Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm; 
amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa, 
ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe, 
ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha. 
 5 O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe niile; 
ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile. 
 6 Ha gbasaara ụkwụ m ụgbụ, 
ihe mgbu nyịturu m. 
Ha egwuola olulu nʼụzọ m si agafe, 
ma ha onwe ha adabala nʼime ya. 
Sela
  7 Obi m dị njikere, o Chineke, 
obi m dị njikere sikwaa ike; 
aga m abụ abụ, kụkwaa egwu. 
 8 Teta nʼụra mkpụrụobi m! 
Teta, ụbọ akwara na une! 
Aga m akpọte chi ọbụbọ. 
 9 O Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile; 
aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche. 
 10 Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu na-eru na mbara eluigwe; 
ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe. 
 11 O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe; 
ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.