Abụ Ọma 53
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Mahalat. Abụ maskil Devid. 
Nzuzu nke ndị na-emebi iwu 
 1 Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya, 
“Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.” 
Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ụzọ ha niile bụkwa ihe arụ; 
ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe. 
 2 Chineke sitere nʼeluigwe 
na-ele ụmụ mmadụ anya, 
ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta, 
onye nke na-achọ Chineke. 
 3 Onye ọbụla, nʼotu nʼotu ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ; 
ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi, 
ọ dịghị ọ bụladị otu onye. 
 4 Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe? 
Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri, 
ha adịghị akpọkukwa Chineke. 
 5 Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu, 
ebe ọ dịghị ihe egwu na-adịghị. 
Chineke fesasịrị ọkpụkpụ ndị niile megidere gị; 
i mere ka ihere mee ha, nʼihi na Chineke ajụla ha. 
 6 O, a sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta! 
Mgbe Chineke ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha, 
ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!