Abụ Ọma 52
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ maskil Devid. Nke o bụrụ mgbe Doeg onye Edọm gara gwa Sọl sị, “Devid gara hụ Ahimelek nʼụlọ ya.” 
Ihe na-eche ndị ajọ omume 
 1 Gịnị mere i ji na-anya isi nʼihe ọjọọ, gị nwoke dị ike? 
Gịnị mere na ogologo ụbọchị niile, ị na-anya isi, 
gị onye Chineke na-eleda anya? 
 2 Ire gị na-atụ atụmatụ ịla nʼiyi; 
ọ dị ka agụba dị nkọ, 
gị onye na-ebi ndụ aghụghọ. 
 3 Ị hụrụ ihe ọjọọ nʼanya karịa ihe ọma, 
ị hụrụ okwu ụgha nʼanya karịa eziokwu. 
Sela
  4 O onye ire aghụghọ! 
Ị hụrụ okwu ọbụla nke na-emegide mmadụ nʼanya. 
 5 Nʼezie, Chineke ga-akwatu gị ruo mgbe ebighị ebi. 
Ọ ga-ejide gị, dọpụta gị site nʼụlọ ikwu gị,* 52:5 Ya bụ, ebe obibi ya 
ọ ga-ehopukwa gị site nʼala ndị dị ndụ. 
Sela
  6 Ndị ezi omume ga-ahụ ya tụkwaa egwu; 
ha ga-achị ya ọchị na-asị, 
 7 “Ugbu a, lee nwoke ahụ, 
onye jụrụ ime Chineke ebe mgbaba ya. 
Ọ tụkwasịrị obi ya na akụnụba ya nke dị ukwuu. 
O sitekwara na ibibi ndị ọzọ ghọọ onye dị ike!” 
 8 Ma adị m ka osisi oliv, 
nke na-eto na-awasa nʼụlọnsọ ukwu Chineke. 
Ana m atụkwasị obi m nʼịhụnanya Chineke, 
nke na-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi. 
 9 Aga m eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi nʼihi ihe i mere; 
aga m eto gị nʼihu ndị gị dị nsọ. 
Olileanya m ga-adị nʼime aha gị, 
nʼihi na aha gị dị mma.