Nchịkọta Akwụkwọ nke Abụọ 
 42
Abụ Ọma 42–72 
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Maskil nke ụmụ Kora. 
Iru ụjụ na nkasiobi onye ezi omume 
 1 Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele, 
otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke. 
 2 Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ. 
Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke? 
 3 Anya mmiri m aghọọlara m ihe oriri 
nʼehihie ma nʼabalị, 
mgbe ndị mmadụ na-asị m ogologo ụbọchị niile, 
“Olee ebe Chineke gị nọ?” 
 4 Ihe ndị a ka m na-echeta 
mgbe m na-ekwupụta ihe mgbu nke obi m: 
ma m cheta mgbe mụ na igwe mmadụ so aga, 
mgbe m ji iti mkpu ọṅụ na ekele na-edu ha 
nʼetiti ọha kachasị ibe ya, ndị ọṅụ juru obi, 
na-aga nʼụlọ Chineke. 
 5 O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? 
Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? 
Nwee olileanya na Chineke, 
nʼihi na m ka ga-eto ya, 
Onye nzọpụta m na Chineke m. 
 6 Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m; 
ya mere, aga m echeta gị 
site nʼala Jọdan, 
na ebe dị elu nke Hemon,* 42:6 Hemon bụ obodo dị nʼoke ala nkwa ahụ nʼebe ugwu. na sitekwa nʼugwu Miza. 
 7 Ogbu mmiri na-akpọku ogbu mmiri 
mgbe olu ha na-ada ụda nʼetiti nruda mmiri gị niile; 
ebili mmiri gị niile na mmali mmiri gị niile 
ekpuchiela isi m. 
 8 Nʼehihie, Onyenwe anyị na-awụkwasị m ịhụnanya ya, 
nʼabalị abụ ya dị m nʼobi, 
ekpere nye Chineke nke ndụ m. 
 9 Ana m asị Chineke, oke nkume m, 
“Gịnị mere i ji chefuo m? 
Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ 
nʼihi mmegbu nke onye iro?” 
 10 Ọkpụkpụ m na-agabiga oke ihe mgbu, 
mgbe ndị iro m ji m na-eme ihe ọchị, 
ogologo ụbọchị niile ha na-ajụ m, 
“Olee ebe Chineke gị nọ?” 
 11 O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? 
Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? 
Nwee olileanya na Chineke, 
nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ, 
Onye nzọpụta m na Chineke m.