Abụ Ọma 43
Arịrịọ maka enyemaka 
 1 O Chineke, kpepụta m, 
kpechitere m ikpe m 
nʼebe mba na-amaghị Chineke nọ; 
gbapụta m site nʼaka 
ndị ajọ omume na ndị aghụghọ. 
 2 Ị bụ Chineke, ebe m e wusiri ike. 
Gịnị mere i ji jụ m? 
Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ, 
nʼihi mmegbu nke onye iro? 
 3 Zipụ ìhè gị na eziokwu gị, 
ka ha duo m; 
ka ha kpọbata m nʼugwu nsọ gị, 
bụ ebe i bi. 
 4 Mgbe ahụ, aga m aga nʼebe ịchụ aja Chineke, 
gakwuru Chineke, bụ ọṅụ m na obi ụtọ m. 
Aga m eji ụbọ akwara too gị, 
O Chineke, bụ Chineke m. 
 5 O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? 
Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? 
Nwee olileanya na Chineke, 
nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ, 
onye Nzọpụta m na Chineke m.