Abụ Ọma 41
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. 
Ekpere onye ọrịa 
 1 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ ndị nwere uche na-eleta ndị ogbenye; 
Onyenwe anyị na-azọpụta ha nʼoge nsogbu. 
 2  Onyenwe anyị ga-echebe ha, debekwa ha ndụ; 
ọ ga-eme ka ihe na-agara ha nke ọma nʼala ahụ, 
ọ gaghị arara ha nye nʼọchịchọ ndị iro ha. 
 3  Onyenwe anyị na-elekọta ha mgbe ahụ na-esighị ha ike, 
meekwa ka ahụ dị ha mma. 
 4 Ekwuru m sị, “O Onyenwe anyị, meere m ebere; 
gwọọ m, nʼihi na emehiela m megide gị.” 
 5 Ndị iro m na-esite nʼiro ha ekwu okwu megide m 
na-asị, “Olee mgbe ọ ga-anwụ ka aha ya laa nʼiyi?” 
 6 Mgbe otu nʼime ha bịara ịhụ m, 
ọ na-ekwu okwu ụgha, ma obi ya na-achịkọta ihe nkwulu; 
mgbe ahụ ọ na-apụ, ga kọsaa ya. 
 7 Ndị niile kpọrọ m asị na-agbarịta izu megide m; 
ha na-echekwa echiche ọjọọ banyere m, na-asịrịta onwe ha: 
 8 “Ọrịa ọjọọ adakwasịla ya; 
ọ gaghị esite na ihe ndina ya bilie ọtọ ọzọ.” 
 9 Ọ bụladị ezigbo enyi m, 
onye m tụkwasịrị obi, 
onye mụ na ya na-eso erikọ nri m, 
ebiliela imegide m. 
 10 Ma gị, O Onyenwe anyị, meere m ebere, 
mee ka ahụ sie m ike ọzọ, ka m nwee ike kwụghachi ha ụgwọ. 
 11 Amaara m na ihe banyere m na-atọ gị ụtọ nʼobi, 
nʼihi na i kwebeghị ka ndị iro m nwee mmeri nʼebe m nọ. 
 12 Nʼihi ikwesi ntụkwasị obi m, ị na-akwagide m, 
mee ka m nọrọ nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi. 
 13 Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, 
site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. 
Amen na Amen.