Abụ Ọma 37
Abụ Ọma Devid. 
Ọgwụgwụ ndụ mmadụ 
 1 Echegbula onwe gị nʼihi ndị na-eme ihe ọjọọ, 
maọbụ kwosa ndị na-eme ihe ọjọọ ekworo; 
 2 nʼihi na mgbe na-adịghị anya, ha ga-akpọnwụ dịka ahịhịa, 
dịka ahịhịa ndụ, ha ga-anwụkwa. 
 3 Tụkwasị Onyenwe anyị obi meekwa ihe ziri ezi; 
biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ. 
 4 Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ. 
Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị. 
 5 Nyefee onwe gị nʼaka Onyenwe anyị; 
tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a: 
 6 Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ, 
meekwa ka izi ezi nke ikpe gị dịka ihe nke anyanwụ nʼehihie. 
 7 Dere duu nʼihu Onyenwe anyị, 
were ndidi chere ya; 
echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu, 
mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile. 
 8 Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe; 
echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ. 
 9 Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi, 
ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha. 
 10 Ọ fọdụrụ nwa oge nta, ndị ajọ omume ga-agabiga; 
ọ bụ ezie na ị ga-achọ ha, ma ị gaghị achọta ha. 
 11 Ma ndị niile dị nwayọọ nʼobi ga-eketa ala a dịka ihe nketa ha, 
ha ga-enwekwa udo dị ukwuu. 
 12 Ndị ajọ omume na-agba izu ọjọọ megide ndị ezi omume, 
na-ata ikekere eze megide ha; 
 13 ma onyenwe anyị na-achị ndị ajọ omume ọchị, 
nʼihi na ọ maara na ụbọchị ha na-abịa. 
 14 Ndị ajọ omume amịpụtala mma agha ha, 
kwee ụta ha 
ime ka ndị nọ na mkpa na ndị ogbenye daa, 
igbu ndị ụzọ ha ziri ezi. 
 15 Ma ha ga-ewere mma agha ha gbuo onwe ha, 
kụrisiekwa ụta ha. 
 16 Ihe ntakịrị nke onye ezi omume nwere 
dị mma karịa akụnụba ọtụtụ ndị ajọ omume; 
 17 nʼihi na a ga-etiji ike niile nke ndị ajọ omume, 
ma Onyenwe anyị ga-akwagide ndị ezi omume. 
 18 Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta Onyenwe anyị, 
ihe nketa ha ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 19 Nʼoge ihe ndakwasị, ha agaghị akpọnwụ; 
ha ga-erijukwa afọ nʼụbọchị ụnwụ. 
 20 Ma ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi. 
Nʼagbanyeghị na ndị iro Onyenwe anyị dịka ịma mma nke ubi ahịhịa ndụ, 
ha ga-agabigakwa ngwangwa nʼanya dịka anwụrụ ọkụ. 
 21 Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya, 
ma onye ezi omume na-eme amara na-enye ndị ọzọ ihe o nwere. 
 22 Ndị Onyenwe anyị gọziri agọzi ga-eketa akụ nke ụwa, 
ma ndị ọ bụrụ ọnụ ka a ga-egbuchapụ. 
 23 Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ, 
ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike; 
 24 ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada, 
nʼihi na Onyenwe anyị na-eji aka ya ejigide ya. 
 25 Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi, 
ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume, 
maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri. 
 26 Mgbe niile, ha na-eme amara jiri obi ha na-agbazinye ndị mmadụ ihe, 
ụmụ ha ga-abụ ngọzị. 
 27 Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe, 
mgbe ahụ, i ga-ebi nʼala a ruo mgbe ebighị ebi. 
 28  Onyenwe anyị na-ahụ onye ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya. 
Ọ gaghị ahapụkwa ndị ya kwesiri ntụkwasị obi. 
A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi, 
ma ụmụ ndị ajọ omume ka a ga-egbuchapụ; 
 29 ndị ezi omume ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha, 
ha ga-ebikwa nʼime ya ruo mgbe ebighị ebi. 
 30 Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta, 
ire ya na-ekwukwa ihe ziri ezi. 
 31 Iwu Chineke ya dị ya nʼobi; 
nzọ ukwu ha adịghị agbụchapụ. 
 32 Ndị ajọ omume na-echere ndị ezi omume na nzuzo, 
na-achọ ịnapụ ha ndụ ha; 
 33 ma Onyenwe anyị agaghị ahapụ ha nʼaka ha, 
ọ gaghị ekwe ka a maa ha ikpe mgbe a na-ekpe ha ikpe. 
 34 Chere Onyenwe anyị, 
debekwa ụzọ ya. 
Ọ ga-ebuli gị elu ka i nweta ala ahụ dịka ihe nketa; 
mgbe a na-egbuchapụ ndị ajọ omume, ị ga-eji anya gị hụ ya. 
 35 Ahụla m onye ajọ omume na nwoke na-eme ihe ike, 
ka ọ na-eto, na-awasa, dịka osisi dị ndụ nʼezi ala, 
 36 ma ọ dịghị anya, ọ nwụrụ, 
nʼagbanyeghị na m chọgharịrị ya, ọ dịghị ebe ọbụla a hụrụ ya. 
 37 Ma tụgharịa uche banyere ndị ezi omume, rịbaa ndị ụzọ ha ziri ezi ama; 
ọganihu dịịrị onye udo. 
 38 Ma a ga-ala ndị mmehie niile nʼiyi; 
ọ dịghị olileanya dịịrị ndị ajọ omume. 
 39 Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka Onyenwe anyị bịa; 
ọ bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu.* 37:39  Abụ 9:9; Nhu 1:7 
 40  Onyenwe anyị na-enyere ha aka, na-anapụtakwa ha 
ma na-azọpụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume, 
nʼihi na ha mere ya ebe mgbaba ha.