Abụ Ọma 36
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid, bụ ohu Onyenwe anyị. 
Ajọ omume mmadụ na ịdị mma Chineke 
 1 E nwere m ozi dị nʼime obi nke sitere nʼaka Chineke 
banyere ndụ mmehie nke ndị na-eme ajọ ihe:* 36:1 Maọbụ, Ozi si nʼaka Chineke: Mmebi iwu nke ndị ajọ omume bi nʼime obi ha. 
Ọ dịghị ịtụ egwu Chineke 
dị nʼanya ha. 
 2 Nʼihi ha na-agwarịta onwe ha okwu ire ụtọ nʼanya ha onwe ha, 
na o nweghị ụzọ a ga-esi nwe ike ịchọpụta mmehie ha maọbụ kpọọ ya asị. 
 3 Okwu ọnụ ha niile bụ ihe ọjọọ na aghụghọ; 
ha adịghị eji uche eme ihe maọbụ mee ihe dị mma. 
 4 Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼelu ihe ndina ha, ha na-eche echiche ajọ ihe; 
ha enyefeela onwe ha nʼaka ndụ ajọ omume, 
ha adịghị ajụkwa ihe na-ezighị ezi. 
 5 O Onyenwe anyị, ịhụnanya gị na-eru mbara eluigwe, 
ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa igwe ojii nke eluigwe. 
 6 Ezi omume gị dịka ugwu dị ukwuu, 
ikpe ikpe ziri ezi gị dịka omimi nke oke osimiri. 
O Onyenwe anyị, ị na-echebe ụmụ mmadụ na anụmanụ. 
 7 Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O Chineke! 
Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ. 
 8 Ha na-eri oriri site nʼịba ụba nke ụlọakụ gị; 
Ị na-enyekwa ha mmiri site nʼiyi nke obi ụtọ gị. 
 9 Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị; 
ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè. 
 10 Mee ka ịhụnanya gị na-adịgidere ndị maara gị, 
ka ezi omume gị na-adịgidekwara ndị ziri ezi nʼobi. 
 11 Ekwela ka ndị mpako a zọọ m ụkwụ nʼisi, 
ekwekwala ka aka ndị ajọ omume nupu m nʼebe m guzo. 
 12 Lee ka ndị na-eme ajọ ihe si daa nʼala, 
a kwatuola ha nʼala, ha apụghịkwa ibilite ọzọ.