Abụ Ọma 35
Abụ Ọma Devid. 
Ekpere maka enyemaka 
 1 O Onyenwe anyị, lụso ha ọgụ bụ ndị na-alụso m ọgụ; 
buso ha agha bụ ndị na-ebuso m agha. 
 2 Yikwasị uwe agha gị, werekwa ọta gị; 
bilie bịa nyere m aka. 
 3 Sepụta ùbe gị na anyụike agha gị; 
bịa zute ndị na-achụ m ọsọ. 
Gwa mkpụrụobi m, 
“Abụ m nzọpụta gị.” 
 4 Mee ka ihere mee 
ndị niile na-agbalịsị ike igbu m. 
Ka ndị na-agba izuzu igbu m bụrụkwa ndị a chụghachiri azụ, 
na ndị ihere mere. 
 5 Ka ha dịka igbugbo ọka mgbe oke ifufe na-efe, 
ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụfu ha. 
 6 Mee ka ụzọ ha gbaa ọchịchịrị, bụrụkwa ebe na-amị amị; 
ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụ ha ọsọ. 
 7 Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ha, 
ma ha siere m ọnya, gwukwaara m olulu nʼụzọ m. 
 8 Ka mbibi bịakwasị ha na mberede, 
ka ụgbụ ha zobeere m kee ha; 
ka ha lakwaa nʼiyi site nʼidaba nʼolulu ahụ ha gwuru. 
 9 Mgbe ahụ, mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ na Onyenwe anyị, 
ọ ga-enwekwa obi ụtọ nʼime nzọpụta ya. 
 10 Ihe niile dị nʼime m ga-eti mkpu sị, 
“O Onyenwe anyị, ọ bụ onye dịka gị? 
Ị na-agbapụta ndị na-adịghị ike site nʼaka ndị dị ike karịa ha, 
ma na-anapụta ndị ogbenye ndị chọrọ enyemaka site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ha nwere nʼike.” 
 11 Ndị akaebe, ndị kwara obi nʼazụ na-apụkwute m; 
ha na-ebo m ebubo ihe ndị m na-anụbeghị ihe banyere ha na mbụ. 
 12 Ana m emere ha ihe ọma, ma ha na-akwụghachi m ihe ọjọọ. 
Nke a na-ewute mmụọ m ruo nʼọnwụ. 
 13 Mgbe ha na-arịa ọrịa, eyiri m akwa mkpe, 
site na ibu ọnụ weda onwe m nʼala. 
Mgbe ekpere m lọghachikwutere m na-enweghị ọsịsa, 
 14 ejegharịrị m nʼọnọdụ iru ụjụ, 
dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne m, maọbụ enyi m, 
jegharịakwa nʼobi ọjọọ dịka a ga-asị 
na ọ bụ nne m na-arịa ọrịa ahụ. 
 15 Ma mgbe m dahiere, ha zukọtara na-aṅụrị ọṅụ; 
mgbe m na-adịghị ele anya, ha biliri imegide m. 
Ha na-ekwulu m na-esepụghị aka. 
 16 Dịka ndị ajọ omume, ha na-akwa m emo nʼiwe, 
na-atakwara m ikikere eze ha. 
 17 O Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-ele ihe na-eme? 
Gbapụta ndụ m site na mbibi ha niile, 
site nʼaka ụmụ ọdụm ndị a, gbapụta ndụ m dị oke ọnụahịa. 
 18 Aga m enye gị ekele nʼihu ọha mmadụ dị ukwuu, 
nʼetiti ọha kachasị ibe ya dị ukwuu, ka m ga-anọ too gị. 
 19 Ekwekwala ka ndị ahụ bụ ndị iro m, 
mgbe o nweghị ihe m mere ha, chịa m ọchị; 
ekwekwala ka ndị ahụ kpọrọ m asị nʼihi iro, 
mgbe o nweghị ihe m mere ha nwee izuike. 
 20 Nʼihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu, 
kama ha na-echepụta ebubo ụgha dị iche iche 
megide ndị ahụ na-anọrọ onwe ha jụụ nʼime ala ahụ. 
 21 Nʼiju anya, ha na-ele m anya na-eti mkpu na-asị, 
“Ewoo! Ewoo! Anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ya.” 
 22 O Onyenwe anyị, ị hụla nke a, agbakwala nkịtị; 
anọkwala m nʼebe dị anya, O Onyenwe anyị. 
 23 Teta, bilie bụụrụ m onye mkpepụta m. 
Kpechitere m ọnụ m, Chineke m na onyenwe m. 
 24 O Onyenwe anyị Chineke m, kpepụta m nʼihi ezi omume gị; 
ekwekwala ka ha chịa m ọchị. 
 25 Ekwekwala ka ha sị, “Ahaa, ọ dị ka anyị tụrụ anya ya!” 
Maọbụ sị, “Anyị eloola ya!” 
 26 Mee ka ihere na ọgbaaghara 
bụrụ nke ndị na-achị m ọchị nʼime mkpagbu m; 
were ihere na nweda nʼala yinye ha dịka uwe, 
bụ ndị niile na-ebuli onwe ha elu imegide m. 
 27 Ka ndị niile mkpepụta m dị mma 
were obi ụtọ tie mkpu ọṅụ; 
ka ha na-asị mgbe niile, “Ka e bulie Onyenwe anyị elu, 
onye ọdịmma nke ohu ya na-amasị.” 
 28 Ire m ga-ekwu banyere ezi omume gị 
na otuto gị niile ogologo ụbọchị niile.