Abụ Ọma 15
Abụ Ọma Devid. 
Onye ga-ebi nʼugwu nsọ Onyenwe anyị? 
 1  Onyenwe anyị, onye pụrụ ịnọgide nʼụlọnsọ ukwu gị? 
Onye pụrụ ibi nʼugwu nsọ gị? 
 2 Onye na-ebi ndụ nke na-enweghị ịta ụta, 
onye na-arụ ọrụ ezi omume, 
onye na-ekwu eziokwu site nʼobi ya. 
 3 Onye jụrụ ikwutọsị ndị ọzọ, 
onye na-adịghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ, 
na onye na-adịghị ekwulu mmadụ ibe ya, 
 4 onye na-eleda onye ajọ omume anya, 
ma na-asọpụrụ ndị ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị, 
onye na-adịghị agbanwe nkwa ọbụla o kwere, 
ọ bụladị mgbe nkwa ahụ na-emegide ya, 
 5 onye na-agbazinye mmadụ ego na-anaghị ụma, 
onye na-adịghị a nara ngarị imegide onye aka ya dị ọcha. 
Onye na-eme ihe ndị a 
agaghị ama jijiji nʼọnọdụ ya, mgbe ọbụla.