Abụ Ọma 16
Abụ miktam nke Devid. 
Ekpere maka iguzosi ike 
 1 Chebe m, O Chineke, 
nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ. 
 2 A gwara m Onyenwe anyị, “Ị bụ Onyenwe m, 
e wezuga gị, enwekwaghị m ọdịmma ọbụla.” 
 3 Ana m asị maka ndị nsọ bụ ndị nọ nʼala a, 
“Ha bụ ndị a na-asọpụrụ, ndị ihe ha nʼatọ m ụtọ.” 
 4 Iru ụjụ nke ndị ahụ na-agbaso chi ndị ọzọ ga-aba ụba. 
Agaghị m eso ha wụsa aja ihe ọṅụṅụ ọbara* 16:4 Nʼọtụtụ mba, mmanya bụ ihe e ji agọ ọfọ, ma nʼomenaala mba ụfọdụ, ọbara onye ahụ eji achụ aja ka a na-ewere gwakọọ na mmanya, wụpụ nʼebe ịchụ aja, nke ka a maara dịka aja ọbara. Ọ bụ omenaala mba ndị ahụ na-amaghị Chineke ka onye dere abụ ọma a na-emegide. Lev 18:21; Lev 20:1-2; 2Ez 16:3; 2Ez 23:10. nye chi ndị a, 
maọbụ were egbugbere ọnụ m kpọọ aha ha. 
 5  Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m;† 16:5 Iko a na-ekwu ihe banyere ya nʼebe a bụ iko a na-enye ndị akpọrọ oriri nʼoge mmemme. Dan 5:1-4 
ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza. 
 6 Ọtụtụ oke ala niile dabara m nʼebe dị ezi mma; 
nʼezie, e nwere m ihe nketa nke na-enye m ọṅụ. 
 7 Aga m eto Onyenwe anyị, onye na-adụ m ọdụ; 
ọ bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme. 
 8 Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile. 
Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji. 
 9 Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ; 
aga m anọkwa nʼudo. 
 10 Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ, 
ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi‡ 16:10 Maọbụ, onye gị dị nsọ hụ ire ure. 
 11 I gosila m ụzọ ndụ; 
ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị; 
ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi. 
*Abụ Ọma 16:4 16:4 Nʼọtụtụ mba, mmanya bụ ihe e ji agọ ọfọ, ma nʼomenaala mba ụfọdụ, ọbara onye ahụ eji achụ aja ka a na-ewere gwakọọ na mmanya, wụpụ nʼebe ịchụ aja, nke ka a maara dịka aja ọbara. Ọ bụ omenaala mba ndị ahụ na-amaghị Chineke ka onye dere abụ ọma a na-emegide. Lev 18:21; Lev 20:1-2; 2Ez 16:3; 2Ez 23:10.
†Abụ Ọma 16:5 16:5 Iko a na-ekwu ihe banyere ya nʼebe a bụ iko a na-enye ndị akpọrọ oriri nʼoge mmemme. Dan 5:1-4
‡Abụ Ọma 16:10 16:10 Maọbụ, onye gị dị nsọ