Abụ Ọma 148
Toonu Onyenwe ihe niile 
 1 Toonu Onyenwe anyị. 
Toonu Onyenwe anyị site nʼeluigwe, 
toonu ya nʼebe niile kachasị elu. 
 2 Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile, 
toonu ya, unu usuu ndị agha ya niile. 
 3 Toonu ya, anyanwụ na ọnwa 
toonu ya, kpakpando niile. 
 4 Toonu ya, unu eluigwe kachasị elu 
na unu mmiri dị nʼelu mbara eluigwe. 
 5 Ka ha niile too aha Onyenwe anyị, 
nʼihi na ha niile malitere ịdị site nʼokwu ọnụ ya. 
 6 O doro ha nʼọnọdụ ha ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi; 
o nyere iwu nke a na-agaghị agabiga. 
 7 Toonu Onyenwe anyị, site nʼụwa, 
unu oke anụ mmiri niile na ogbu mmiri niile, 
 8 na amụma, na mkpụrụ mmiri, na snoo na igwe ojii niile, 
na oke ifufe niile na-eme ihe o nyere nʼiwu, 
 9 unu ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile 
na osisi niile na-amị mkpụrụ na osisi sida niile 
 10 na anụ ọhịa, na anụ ụlọ niile, 
na ihe niile na-akpụ akpụ nʼala na nnụnụ niile, 
 11 ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche, 
unu ụmụ eze na ndị niile na-achị achị nʼụwa, 
 12 ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ, 
ndị okenye na ụmụntakịrị. 
 13 Ka ha niile too aha Onyenwe anyị, 
nʼihi na ọ bụ naanị aha ya ka e buliri elu; 
ebube ya dị ukwuu karịa eluigwe na ụwa. 
 14 O meela ka mpi* 148:14 Mpi bụ ihe na-egosipụta ike, gụọ akwụkwọ 1Sa 2:1 ndị ya dị elu, 
otuto ndị nsọ ya niile, 
nke Izrel ndị ọ hụrụ nʼanya. 
Toonu Onyenwe anyị.