Abụ Ọma 147
Onyenwe anyị dike, na onye amara 
 1 Toonu Onyenwe anyị! 
Ọ bụ ihe dị mma ịbụku Chineke anyị abụ otuto. 
Ọ bụ ihe na-eweta mmasị, bụrụkwa ihe ziri ezi ito ya! 
 2  Onyenwe anyị na-ewu Jerusalem: 
ọ na-akpọghachita ụmụ Izrel ndị a dọọrọ nʼagha gaa nʼala ọzọ. 
 3 Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa 
na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ. 
 4 Ọ bụ ya na-ekpebi ọnụọgụgụ kpakpando niile 
na-akpọkwa ha nʼotu na otu.* 147:4  Aịz 40:26 
 5 Onyenwe anyị dị ukwuu, ike ya dịkwa ukwuu; 
nghọta ya enweghị nsọtụ. 
 6  Onyenwe anyị na-agba ndị dị umeala nʼobi ume 
ma ọ na-atụda ndị ajọ omume nʼala. 
 7 Jirinụ ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ; 
jirinụ ụbọ akwara kpọọrọ Chineke anyị egwu. 
 8 Ọ na-eji igwe ojii na-ekpuchi mbara eluigwe; 
ọ na-ewetara elu ụwa mmiri ozuzo 
na-eme ka ahịhịa puo nʼelu ugwu niile. 
 9 Ọ na-enye ehi niile nri 
na-enyekwa ụmụ ugolọma nri mgbe ha na-ebeku ya akwa nʼihi nri. 
 10 Mmasị ya adịghị nʼike nke ịnyịnya, 
maọbụ nʼike ụkwụ nke mmadụ. 
 11  Onyenwe anyị na-enwe mmasị nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, 
ndị olileanya ha dị na ịhụnanya ya nke na-adịghị agharịpụ. 
 12 O Jerusalem, jaa Onyenwe anyị mma; 
o Zayọn, too Chineke gị. 
 13 Nʼihi na o wusiela mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị niile ike, 
na-agọzikwa ndị niile bi nʼime gị. 
 14 Ọ na-eme ka oke ala gị nwee udo, 
jirikwa ọka wiiti kachasị mma nyejuo gị afọ. 
 15 Ọ na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile; 
okwu ya na-agbasa ngwangwa. 
 16 Ọ na-atụsa snoo nʼala dịka ajị anụ, 
na-efesasị igirigi snoo dịka ntụ. 
 17 Ọ na-atụdata mkpụrụ mmiri ya dị ka mkpụrụ okwute. 
Onye pụrụ iguzogide oke ifufe oyi ya? 
 18 Ọ na-ezipụ okwu ya na-agbaze ha; 
ọ na-akpalịte ikuku ya mee ka mmiri bido ịsọgharị. 
 19 O kpugheela okwu ya nye Jekọb, 
iwu ya na ụkpụrụ ya niile nye Izrel. 
 20 O mesobeghị mba ọzọ ụdị mmeso dị otu a. 
Ha amakwaghị iwu ya niile. 
Toonu Onyenwe anyị!