Abụ Ọma 146
Tụkwasị Chineke obi 
 1 Toonu Onyenwe anyị. 
O mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị. 
 2 Aga m eto Onyenwe anyị ogologo ndụ m niile; 
aga m abụ abụ otuto nye Chineke m mgbe m nọ na-adị ndụ. 
 3 Atụkwasịla ụmụ eze obi gị, 
ndị bụ mmadụ efu na-apụghị ịzọpụta. 
 4 Mgbe mmụọ ha pụrụ, ha na-alaghachi nʼaja* 146:4  Ekl 12:7; 
nʼụbọchị ahụ, atụmatụ ha na-aghọ ihe efu. 
 5 Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye inyeaka ya bụ Chineke nke Jekọb, 
onye olileanya ya dị na Onyenwe anyị, Chineke ya. 
 6 Onye kere eluigwe na ụwa, 
na osimiri, na ihe niile dị nʼime ha, 
Onyenwe anyị, onye ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 7 Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-akpagbu 
na-enyekwa ndị agụụ na-agụ nri. 
Onyenwe anyị na-eme ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ nwere onwe ha, 
 8  Onyenwe anyị na-emeghe anya ndị kpuru ìsì, 
Onyenwe anyị na-akwagide ndị niile dara mba, 
Onyenwe anyị hụrụ ndị ezi omume niile nʼanya. 
 9  Onyenwe anyị na-echebe ndị ọbịa, 
na-elekọtakwa ndị na-enweghị nna na ndị di ha nwụrụ anwụ, 
ma ọ na-eme ka ihe ghara ịgara ndị ajọ omume nke ọma. 
 10  Onyenwe anyị na-achị ruo ebighị ebi, 
Chineke gị, o Zayọn, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 
Toonu Onyenwe anyị.