Abụ Ọma 141
Abụ Ọma Devid. 
Arịrịọ nke ezi mmadụ 
 1 O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị; bịakwute m ọsịịsọ. 
Nụrụ olu m mgbe m na-akpọku gị. 
 2 Ka ekpere m bịa nʼihu gị dịka ihe na-esi isi ụtọ; 
ka nchili elu nke m chịlịri aka m abụọ dịrị ka aja a na-achụ nʼanyasị. 
 3 Nyere m aka ka m mechie ọnụ m, o Onyenwe anyị; 
na-echekwa egbugbere ọnụ m nche. 
 4 Ekwela ka obi m nwee mmasị nʼihe ọjọọ, 
isonye ndị na-eme ihe ọjọọ 
rụọ ọrụ ajọ omume niile dị iche iche; 
ekwela ka m soro ha rikọọ ihe ụtọ ha niile.* 141:4  Ilu 23:6 
 5 Ka onye ezi omume tie m ihe, nke a na-egosi obi ebere; 
ka ọ baara m mba, nke a bụ mmanụ nʼelu isi m. 
Isi m agaghị ajụ ya. 
Otu ọ dị, ekpere m na-emegide ọrụ niile nke ndị na-eme ihe ọjọọ. 
 6 A ga-esite nʼelu nkume dị elu tụda ndị na-achị ha, 
mgbe ahụ, ndị ajọ omume ga-amata na okwu m niile bụ eziokwu. 
 7 Ha ga-ekwu sị, “Dịka mmadụ na-egburi, na-akọgharị ala, 
otu a ka a ghasasịrị ọkpụkpụ anyị nʼọnụ ili.” 
 8 Ma olileanya m dị na gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị 
nʼime gị ka m gbabara izere ndụ, ararala m nyefee nʼaka ọnwụ. 
 9 Napụta m ka m ghara ịdaba nʼime ọnya igbudu niile nke ndị na-eme ajọ ihe siiri, 
sitekwa nʼọnya niile ha siiri m. 
 10 Ka ndị ajọ omume daba nʼime ụgbụ ha, 
ma mụ onwe m ga-agabiga na-emerụghị ahụ ọbụla.