Abụ Ọma 139
Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. 
Chineke maara ihe niile 
 1 O Onyenwe anyị, ị nyochaala m, 
ị makwaara m nke ọma 
 2 Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ; 
site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile. 
 3 Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m; 
ị mazukwara ụzọ m niile. 
 4 O Onyenwe anyị, ị maara ihe m gaje ikwu 
tupu m kwuo ya. 
 5 Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ, 
ị tụkwasịla m aka gị. 
 6 Ihe ọmụma dị otu a dị oke omimi nye m, 
ọ dịkwa elu apụghị m iru ya. 
 7 Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị? 
Ebeekwa ka m pụrụ ịgbaga ka m si nʼihu gị zoo onwe m? 
 8 Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ. 
Ọ bụrụkwa na m arịda zoo onwe m nʼala mmụọ, ị nọkwa nʼebe ahụ. 
 9 Ọ bụrụ na m efepụ nʼisi ụtụtụ dịka nwa nnụnụ, felagaa 
nʼebe dị nnọọ anya nke oke osimiri, 
 10 ọ bụladị nʼebe ahụ ka aka gị ga na-edu m 
aka nri gị ga-ejidesi m ike. 
 11 Ọ bụrụ na m asị, “Nʼezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi m 
ìhè ga-aghọ abalị gbaa m gburugburu.” 
 12 Ọ bụladị ọchịchịrị agaghị abụ ọchịchịrị nʼebe ị nọ; 
abalị ga-enye ìhè dịka ehihie, 
nʼihi na ọchịchịrị dị ka ìhè nʼebe ị nọ.* 139:12  Job 26:6; Job 34:22; Hib 4:13 
 13 Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ. 
Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m. 
 14 Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; 
ọrụ gị niile dị ebube; 
amaara m nke a nke ọma. 
 15 Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ 
mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ, 
mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa. 
 16 Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla. 
E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị 
tupu otu nʼime ha adịrị. 
 17 Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke! 
Leekwa ka ha si dị ukwuu. 
 18 Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ, 
ha ga-adị ukwuu karịa ọnụọgụgụ aja dị nʼala. 
Mgbe m tetara, mụ na gị ka nọ. 
 19 O Chineke, a sịkwarị na ị ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi! 
Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-akwafu ọbara! 
 20 Site nʼechiche ọjọọ, ha na-ekwu okwu banyere gị; 
ndị iro gị na-ekwutọ aha gị. 
 21 O Onyenwe anyị, ọ bụ na m akpọghị ha asị bụ ndị kpọrọ gị asị, 
na-asọkwa ndị na-enupu isi megide gị oyi? 
 22 Ọ bụ naanị ịkpọ asị ka m nwere nʼebe ha nọ? 
Ana m agụnye ha dịka ndị iro m. 
 23 O Chineke, nyochaa m, mara obi m. 
Nwaa m, matakwa echiche uche m niile. 
 24 Chọpụta ma o nwere ihe ọjọọ dị nʼime m, 
ma duo m nʼụzọ ebighị ebi.