Abụ Ọma 138
Abụ Ọma Devid. 
Onyenwe anyị bụ onye kwesiri ntụkwasị obi 
 1 O Onyenwe anyị, aga m eji obi m niile too gị; 
nʼihu chi niile dị iche iche ka m ga-abụku gị abụ otuto. 
 2 Aga m akpọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị 
aga m etokwa aha gị 
nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, 
nʼihi na i meela ka aha gị na okwu gị 
dị elu karịa ihe niile.* 138:2  Aịz 42:21 
 3 Mgbe m kpọkuru gị, ị zara m; 
i mere m ka m nwee nkwuwa okwu ma guzosiekwa ike. 
 4 O Onyenwe anyị, ka ndị eze niile nọ nʼụwa too gị, 
mgbe ha nụrụ ihe niile i nyere nʼiwu. 
 5 Ka ha bụọ abụ banyere ụzọ niile nke Onyenwe anyị, 
nʼihi na ebube Onyenwe anyị dị ukwuu. 
 6 Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ na-elekwasị ndị dị umeala nʼobi anya, 
ma ọ naghị ekwe ka ndị nganga bịa ya nso. 
 7 A sịkwarị na m na-eje ije nʼetiti nsogbu, 
ị na-echebe ndụ m; 
ị na-esetipụ aka gị megide iwe ndị kpọrọ m asị, 
ị na-eji aka nri gị zọpụta m.† 138:7  Abụ 23:3-4 
ịhụnanya gị, o Onyenwe anyị, na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, 
ahapụkwala ọrụ aka gị niile.