Abụ Ọma 134
Abụ nrigo. 
Toonu Onyenwe anyị 
 1 Toonu Onyenwe anyị, unu ndị ohu Onyenwe anyị niile 
ndị na-eje ozi nʼime ụlọ Onyenwe anyị nʼoge abalị. 
 2 Chilienụ aka unu abụọ elu nʼime ụlọnsọ ya* 134:2  1Tm 2:8 
ma toonu Onyenwe anyị. 
 3 Ka Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa 
site na Zayọn gọzie unu.