Abụ Ọma 110
Abụ Ọma Devid. 
Onyenwe anyị na onye ya o tere mmanụ 
 1  Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị ya: 
“Nọdụ ala nʼaka nri m 
ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị 
ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.”* 110:1 Nʼoge ochie, a na-arụ ocheeze nʼebe dị elu, ma nwee ihe nrigo e ji arịgoru ya. Mgbe ahụ, ndị eze na-achịkwasa ụkwụ ha nʼolu ndị ha meriri nʼagha, Mat 22:44; Mak 12:36; Luk 20:42-43; Hib 1:13; 1Kọ 15:25. 
 2  Onyenwe anyị ga-eme ka ike ọchịchị gị site na Zayọn ruo ala ndị ọzọ; 
ị ga-achị nʼetiti ndị iro gị niile. 
 3 Nʼụbọchị ị ga-ebu agha, 
ndị agha gị niile ga-ahọrọ nʼonwe ha i soro gị. 
Ndị yikwasịrị ịma mma nke ịdị nsọ ka uwe, 
bụ ụmụ okorobịa gị ga-abịakwute gị 
dịka igirigi site nʼafọ ụtụtụ. 
 4  Onyenwe anyị aṅụọla iyi, 
ọ gaghị agbanwe uche ya: 
“Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, 
nʼusoro Melkizedek.” 
 5 Onyenwe anyị nọ nʼaka nri gị. 
Ọ ga-egwepịa ndị eze nʼụbọchị oke iwe ya. 
 6 Ọ ga-ekpe mba niile ikpe, na-atụkọta ndị nwụrụ anwụ, 
ma gwepịa ndị na-achị achị nʼelu ụwa niile. 
 7 Ọ ga-aṅụ mmiri site nʼiyi nta nke dị nʼakụkụ ụzọ; 
nʼihi nke a, ọ ga-eweli isi ya elu. 
*Abụ Ọma 110:1 110:1 Nʼoge ochie, a na-arụ ocheeze nʼebe dị elu, ma nwee ihe nrigo e ji arịgoru ya. Mgbe ahụ, ndị eze na-achịkwasa ụkwụ ha nʼolu ndị ha meriri nʼagha, Mat 22:44; Mak 12:36; Luk 20:42-43; Hib 1:13; 1Kọ 15:25.