Abụ Ọma 111
Toonu Onyenwe anyị 
 1 Toonu Onyenwe anyị! 
Aga m eji obi m niile jaa Onyenwe anyị mma 
nʼime nzukọ ndị ụzọ ha ziri ezi na nʼime ọgbakọ ukwuu. 
 2 Ọrụ niile Onyenwe anyị na-arụ dị ukwuu; 
ndị niile na-enwe mmasị na ha na-atụgharị uche nʼime ha. 
 3 Ọrụ ya jupụtara nʼebube na ịma mma, 
ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. 
 4 O meela ka e cheta ọrụ ebube ya niile; 
Onyenwe anyị bụ onye amara na onye ọmịiko. 
 5 Ọ na-egboro ndị na-atụ egwu ya mkpa ihe oriri; 
ọ na-echetakwa ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi. 
 6 O gosila ndị ya ike nke ọrụ ya niile, 
site nʼinye ha ala niile nke ndị mba ọzọ. 
 7 Ọrụ aka ya niile bụ ihe kwesiri ekwesi na ikpe ziri ezi; 
ụkpụrụ ya niile bụ ihe kwesiri ntụkwasị obi. 
 8 E hiwere ha ịdị ruo mgbe niile ebighị ebi, 
ha bụ ihe e mere nʼikwesị ntụkwasị obi na izi ezi. 
 9 O wetaara ndị ya mgbapụta; 
o meela ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike ruo ebighị ebi, 
aha ya dị nsọ dịkwa oke egwu. 
 10 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe; 
ndị niile na-edebe ụkpụrụ ya nwere ezi nghọta. 
Otuto ya na-adị ruo mgbe ebighị ebi.