Abụ Ọma 109
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma Devid. 
Ntamu nʼoge nsogbu 
 1 O Chineke, onye m na-eto, 
anọgidekwala na-agba nkịtị, 
 2 nʼihi na ndị ajọ omume na ndị aghụghọ 
emegheela ọnụ ha megide m; 
ha aghaala ụgha megide m. 
 3 Ha na-eji okwu ịkpọ asị gbaa m gburugburu; 
na-ebuso m agha nʼefu. 
 4 Nʼọnọdụ ịhụnanya m hụrụ ha, ha na-ebo m ebubo 
ma abụ m nwoke onye ekpere. 
 5 Ha ji ihe ọjọọ na-akwụ m ụgwọ ihe ọma m mere, 
ịkpọ asị nʼọnọdụ ịhụnanya. 
 6 Họpụta otu onye ajọ omume ka o guzogide ya; 
ka onye na-ebo ebubo ụgha guzokwa nʼaka nri ya. 
 7 Mgbe a ga-ekpe ya ikpe, ka ọ bụrụ onye ikpe mara, 
ka ekpere ya maa ya ikpe ọnwụ. 
 8 Ka ụbọchị ndụ ya dị ole na ole, 
ka onye ọzọ nara ya ọkwa ya. 
 9 Ka ụmụ ya ghọọ ndị na-enweghị nna, 
ka nwunye ya bụrụ nwanyị na-enweghị di. 
 10 Ka ụmụ ya ghọọ ndị arịrịọ na-enweghị ebe obibi, 
ndị e si na mkpọmkpọ ebe ha bi chụpụ. 
 11 Ka ndị o ji ụgwọ kwakọrọ ihe niile o nwere, 
ka ndị ọbịa baa bukọrọ ihe niile ọ rụpụtaara onwe ya. 
 12 Ka onye ọbụla ghara igosi ya obiọma; 
ka onye ọbụla gharakwa imere ụmụ ya ndị ọ hapụrụ ebere. 
 13 Kama ka ụmụ ụmụ ya niile nwụsịa, 
ka a ehichapụkwa aha ha nʼọgbọ nke na-abịa nʼihu. 
 14 Ka Onyenwe anyị chetakwa mmehie niile nke nna nna ya ha, 
ka Onyenwe anyị hapụkwa ịgbaghara mmehie nne ya. 
 15 Ka Onyenwe anyị na-echeta mmehie ha oge niile; 
ma ka o mee ka ha bụrụ ndị a ga-echefu echefu nʼọgbọ niile. 
 16 Nʼihi na ọ dịghị mgbe o chere echiche banyere imere onye ọzọ obi ebere, 
ọ kpagburu ndị ogbenye, ndị nọ na mkpa 
na ndị obi ha tiwara etiwa ruo nʼọnwụ. 
 17 Ọ hụrụ ịbụ ndị ọzọ ọnụ nʼanya, 
ka ọbụbụ ọnụ bịakwasị ya; 
ọ dịghị atọ ya ụtọ ịgọzi onye ọbụla, 
ka ngọzị dị anya site nʼebe ọ nọ. 
 18 O yikwasịrị ịbụ ọnụ dịka uwe ya; 
ọ bara nʼime ahụ ya dịka mmiri, 
bakwaa nʼime ọkpụkpụ ya dịka mmanụ. 
 19 Ka ọ dịịrị ya ka uwe mwụda nke e kere ya gburugburu dịka akwa, 
dịka belịt e kegidere ya gburugburu ruo mgbe ebighị ebi. 
 20  Onyenwe anyị, mee ka nke a bụrụ ụdị ụgwọ ọrụ ndị iro m ga-anata, 
bụ ndị ahụ niile na-ekwu okwu ọjọọ megide m. 
 21 Ma gị onwe gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị 
nyere m aka nʼihi aha gị, 
site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, napụta m. 
 22 Nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa, 
obi m tiwakwara etiwa nʼime m. 
 23 Ana m efu* 109:23 Maọbụ, agba barịị dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ dara; 
adịkwa m ka igurube nke onye m bekwasịrị nʼahụ ya na-efechapụ. 
 24 Ike agwụla ikpere m, nʼihi ibu ọnụ; 
ataakwala m ahụ, bụrụ naanị ọkpụkpụ. 
 25 Aghọọla m onye e ji eme ihe ọchị nye ndị na-ebo m ebubo, 
mgbe ha hụrụ m, ha na-efufe isi ha. 
 26 Nyere m aka, o Onyenwe anyị Chineke m; 
zọpụta m dịka ịhụnanya gị si dị. 
 27 Ka ha mara na ọ bụ aka gị, 
na ọ bụ gị, o Onyenwe anyị, mere ya. 
 28 Ha nwere ike nọgide na-abụ ọnụ, ma ị ga-agọzi; 
mgbe ha ga-abịa ọgụ, a ga-eme ha ihe ihere, 
ma ohu gị ga-aṅụrị ọṅụ. 
 29 A ga-eji ihere yikwasị ndị na-ebo m ebubo dịka uwe 
werekwa ihere kee ha gburugburu dịka uwe mwụda. 
 30 Aga m eji ọnụ m jaa Onyenwe anyị mma nke ukwuu; 
nʼetiti ọha mmadụ dị ukwuu, aga m eto ya. 
 31 Nʼihi na ọ na-eguzo nʼaka nri nke onye nọ na mkpa, 
ịzọpụta ya site nʼaka ndị na-ama ya ikpe ọnwụ.