Abụ Ọma 108
Abụ, Abụ Ọma Devid. 
Ekpere nʼoge nsogbu 
 1 Obi m dị njikere, o Chineke; 
aga m eji mkpụrụobi m niile bụọ abụ ma kụkwaa egwu. 
 2 Teta! Ụbọ akwara na une! 
Aga m akpọte chi ọbụbọ. 
 3 Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼetiti mba niile; 
aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche. 
 4 Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu karịa eluigwe; 
ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe. 
 5 Ka e bulie gị elu, o Chineke, karịa eluigwe niile, 
ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile. 
 6 Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, 
ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya. 
 7 Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, 
“Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem, 
tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ, nyepụ ya. 
 8 Gilead bụ nke m, Manase bụkwa nke m; 
Ifrem bụ okpu igwe m, 
Juda bụ mkpara eze m. 
 9 Moab bụ efere ịkwọ aka m, 
aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm 
nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.” 
 10 Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike? 
Onye ga-edu m gaa Edọm? 
 11 Ọ bụghị gị, o Chineke? Gị onye jụrụ anyị, 
onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha? 
 12 Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro, 
nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu. 
 13 Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri, 
ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.