Abụ Ọma 102
Ekpere nke onye nọ na mmekpa ahụ na ọnọdụ ịda mba, na-ekwupụta otu o si dịrị ya nʼihu Onyenwe anyị. 
Arịrịọ maka ime ebere 
 1 Nụrụ ekpere m, O Onyenwe anyị; 
ka ịkwa akwa m maka inyeaka ruo gị ntị. 
 2 Ezonarịla m ihu gị 
nʼụbọchị nsogbu m. 
Gee ntị nʼekpere m, 
zakwaa m ngwangwa. 
 3 Nʼihi na ụbọchị m niile na-agabiga, dịka anwụrụ ọkụ; 
ọkpụkpụ m niile dịkwa ka ọlọkọ ọkụ. 
 4 Mkpụrụobi m etiwaala abụọ na-achanwụkwa dịka ahịhịa; 
ana m echefu iri nri m. 
 5 Nʼihi oke ịsụ ude m na-asụ, 
enwekwaghị m anụ ahụ ọbụla nʼahụ m. Abụ m naanị ọkpụkpụ. 
 6 Adị m ka ikwighịkwighị nke ọzara, 
a dị m ka ikwighịkwighị nʼetiti ebe dakpọsịrị adakpọsị. 
 7 Ana m amụ anya abalị niile; 
adị m ka nwa nnụnụ naanị ya bekwasịrị nʼelu ụlọ. 
 8 Ụbọchị niile, ndị iro m na-eji m eme ihe ọchị; 
ndị na-akwa m emo na-eji aha m mere ihe ịbụ ọnụ. 
 9 Nʼihi na ejirila m ntụ mere ihe oriri m, 
anya mmiri m na-agwakọta nʼiko ihe ọṅụṅụ m 
 10 nʼihi oke iwe gị, 
i bulitela m, ma tụpụ m nʼakụkụ. 
 11 Ụbọchị m niile dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ na-ada. 
Ana m akpọnwụ akpọnwụ, dịka ahịhịa. 
 12 Ma gị Onyenwe anyị, na-anọgide nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi; 
aha gị ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 
 13 Ị ga-ebili nwee ọmịiko nʼebe Zayọn nọ, 
nʼihi na oge izi ya ihuọma eruola; 
oge ahụ a kara aka eruola. 
 14 Nʼihi na nkume ya niile dị oke ọnụahịa nye ndị ohu gị; 
mgbe ha hụrụ uzuzu ya, ha na-emere ya ebere. 
 15 Mba niile ga-atụ egwu aha Onyenwe anyị, 
ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị. 
 16 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ewugharị Zayọn, 
ọ ga-apụta ihe nʼebube ya. 
 17 Ọ ga-aza ekpere ndị nọ na mkpa; 
ọ gaghị eleda arịrịọ ha anya. 
 18 Ka e depụta ihe ndị a maka ọgbọ nke dị nʼihu, 
ka ndị a na-amụbeghị nwee ike too Onyenwe anyị: 
 19 “Onyenwe anyị sitere nʼebe nsọ ya dị elu ledata anya, 
o sitere nʼeluigwe ledata anya ya nʼụwa, 
 20 ịnụ ịsụ ude nke ndị a tụrụ mkpọrọ 
na ịgbapụta ndị a mara ikpe ọnwụ.” 
 21 Nʼihi nke a, a ga-ekwuwapụta aha Onyenwe anyị na Zayọn; 
a ga-eto ya na Jerusalem, 
 22 mgbe mba niile na alaeze niile, 
ga-ezukọta nʼotu ebe, ife Onyenwe anyị ofufe. 
 23 O meela ka ike gwụ m nʼoge ndụ m; 
o meela ka ndụ m dịrị mkpụmkpụ. 
 24 Nʼihi ya, ekwuru m sị, 
“Anapụla m ndụ m, o Chineke m, ugbu a m ka dị ndụ; 
ị na-adịgide ndụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 
 25 Na mmalite, ị tọrọ ntọala ụwa, 
eluigwe bụkwa ọrụ aka gị. 
 26 Ha ga-ala nʼiyi, ma ị ga-adịgide; 
ha ga-erichasị dịka akwa ochie. 
Ị ga-agbanwe ha dịka mmadụ si agbanwe uwe ya, 
ha ga-abụ ndị ewezugara ewezuga. 
 27 Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe,* 102:27  Aịz 41:1; Aịz 43:10; Mal 3:6; Hib 13:8; Jem 1:17 
ọnụọgụgụ afọ gị adịghị agwụkwa agwụ. 
 28 Ụmụ ndị ohu gị ga-ebigide; 
ụmụ ụmụ ha ga-eguzosie ike nʼihu gị.”