Abụ Ọma 103
Abụ Ọma Devid. 
Gọzie Onyenwe anyị 
 1 Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; 
ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya. 
 2 Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; 
echefukwala mmeso ọma ya niile, 
 3 ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile; 
na-agwọkwa gị ọrịa gị niile, 
 4 onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu 
werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze, 
 5 onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile, 
ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo.* 103:5 Ugo Ọ bụ ịdị ike na ndụ ogologo ka e ji mara nnụnụ ugo. 
 6  Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ezi omume, 
na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu. 
 7 O mere ka Mosis mata ụzọ ya, 
mekwaa ka ụmụ Izrel mara ọrụ ya dị iche iche: 
 8  Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara. 
Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya. 
 9 Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi, 
ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta; 
 10 ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị, 
ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị. 
 11 Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, 
otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ. 
 12 Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ, 
otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ. 
 13 Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ, 
otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, 
 14 nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị, 
ọ na-echeta na anyị bụ aja. 
 15 Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa, 
ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa, 
 16 ifufe na-efesi ya ike, ọ na-adakwa, 
adịghị echetakwa ya nʼọnọdụ mbụ ya. 
 17 Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide site 
nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya. 
Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha, 
 18 nye ndị ahụ niile na-edebe ọgbụgba ndụ ya 
na ndị na-echeta irubere ụkpụrụ ya isi. 
 19  Onyenwe anyị emeela ka ocheeze ya guzosie ike nʼeluigwe, 
alaeze ya na-achị ihe niile. 
 20 Toonu Onyenwe anyị, unu ndị mmụọ ozi ya, 
unu ndị dị ike ndị na-eme ihe ọ chọrọ, 
na-erubere okwu ya isi. 
 21 Toonu Onyenwe anyị unu usuu ndị agha ya niile; 
unu ndị na-ejere ya ozi, ndị na-eme uche ya. 
 22 Toonu Onyenwe anyị, ọrụ aka ya niile 
nʼebe ọbụla ọ na-achị. 
Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.