Abụ Ọma 100
Abụ Ọma maka ikele ekele afọ ojuju. 
Toonu Chineke 
 1 Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile. 
 2 Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe; 
jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya 
 3 Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke. 
Ọ bụ ya onwe ya kere anyị,* 100:3  Job 10:3; Efe 2:10 ọ bụkwa ya nwe anyị, 
anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ. 
 4 Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya 
jiri otuto baa nʼogige ya; 
keleenụ ya, tookwa aha ya. 
 5 Nʼihi na Onyenwe anyị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.