Abụ Ọma 91
Chineke onye na-echebe anyị 
 1 Onye ahụ na-ebi nʼebe mgbaba Onye kachasị ihe niile elu 
ga-ezu ike nʼokpuru ndo Onye pụrụ ime ihe niile. 
 2 Nke a ka m ga-ekwu maka Onyenwe anyị, “Ọ bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike, 
Chineke m, onye m na-atụkwasị obi m.” 
 3 Nʼezie, ọ ga-anapụta gị 
site nʼọnya nke onye osi ọnya 
na site nʼaka ajọ ọrịa na-efe efe na-eweta ịla nʼiyi. 
 4 Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị. 
Ọ bụkwa nʼokpuru nku ya abụọ, ka ị ga-agbaba zere ndụ, 
ikwesi ntụkwasị obi ya ga-echebe gị, ghọkwaara gị ọta. 
 5 Ị gaghị atụ egwu ihe ịtụ oke egwu nke abalị, 
maọbụ àkụ na-efegharị nʼehihie, 
 6 maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe, nke na-ejegharị nʼọchịchịrị, 
ma ọ bụkwanụ ihe mbibi mberede na-eme nʼehihie. 
 7 Puku mmadụ pụrụ ịda nʼakụkụ gị, 
iri puku mmadụ nwekwara ike ịda nʼakụkụ aka nri gị, 
ma ihe ọjọọ ndị a agaghị erute gị nso. 
 8 Ọ bụ naanị anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ 
ntaramahụhụ nke ndị ajọ omume. 
 9 Ọ bụrụ na i mee Onye kachasị ihe niile elu ebe obibi gị, 
ọ bụladị Onyenwe anyị, onye bụ ebe mgbaba m, 
 10 mgbe ahụ, ihe ọjọọ ọbụla enweghị ike ịdakwasị gị; 
ihe ike ọbụla enweghị ike ịbịaru ụlọ obibi gị nso. 
 11 Nʼihi na ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, 
ka ha chebe gị nʼụzọ gị niile.* 91:11  Abụ 34:7; Mat 4:6; Luk 4:10; Hib 1:14 
 12 Ha ga-eji ọbụ aka ha, 
bulie gị elu ime ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume. 
 13 Ị ga-azọkwasị ọdụm na ajụala ụkwụ, 
zọgbukwaa ọdụm na-akpa ike, na agwọ ọjọọ. 
 14 “Nʼihi na ọ hụrụ m nʼanya, Mụ onwe m ga-agbapụta ya, ka Onyenwe anyị kwuru; 
aga m echebe ya, nʼihi na ọ maara aha m. 
 15 Ọ ga-akpọku m, aga m azakwa ya. 
Aga m anọnyere ya nʼime nsogbu ya, 
aga m adọpụta, ma sọpụrụkwa ya.† 91:15  Job 12:4; Abụ 50:15; Aịz 43:2 
 16 Aga m eji ogologo ndụ mee ka afọ ju ya, 
gosikwa ya nzọpụta m.” 
*Abụ Ọma 91:11 91:11 Abụ 34:7; Mat 4:6; Luk 4:10; Hib 1:14
†Abụ Ọma 91:15 91:15 Job 12:4; Abụ 50:15; Aịz 43:2