Abụ Ọma 85
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora. 
Ekpere maka ihuọma 
 1 O Onyenwe anyị, i gosila ala gị ihuọma; 
i nyeghachila Jekọb akụnụba ya. 
 2 I gbagharala ajọ omume ndị gị, 
kpuchikwaa mmehie ha niile. 
Sela
  3 Ị kwụsịla iwe oke iwe gị, 
I sikwala nʼịdị ọkụ nke iwe gị chigharịa. 
 4 Kpọghachi anyị azụ, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị, 
wezuga iwe gị site nʼebe anyị nọ. 
 5 Ọ bụ ruo mgbe ebighị ebi, ka ị ga na-eweso anyị iwe: 
Ị ga-eme ka iwe gị dịgide ruo ọgbọ niile? 
 6 Ị gaghị eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ 
ka ndị gị ṅụrịa ọṅụ nʼime gị? 
 7 O Onyenwe anyị, gosi anyị ịhụnanya gị nke na-adịgide, 
nyekwa anyị nzọpụta gị. 
 8 Aga m ege ntị mara ihe Chineke, onye bụ Onyenwe anyị ga-ekwu; 
ọ na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo, 
ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu. 
 9 Nʼezie, nzọpụta ya dị nso* 85:9  Aịz 46:13 ndị na-atụ egwu ya, 
ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị. 
 10 Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala; 
ezi omume na udo esutula ọnụ. 
 11 Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta, 
ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya. 
 12 Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma, 
ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya. 
 13 Ezi omume ga-aga nʼihu ya, 
idoziri ya ụzọ ọ ga-esi gaa.