Abụ Ọma 86
Ekpere Devid. 
Ekpere maka enyemaka 
 1 Gee m ntị, O Onyenwe anyị, ma zakwa m, 
nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa. 
 2 Chebe ndụ m, nʼihi na m na-erubere gị isi; 
zọpụta ohu gị onye nke na-atụkwasị gị obi. 
Ị bụ Chineke m;  3 meere m ebere, O Onyenwe m, 
nʼihi na ana m akpọku gị ogologo ụbọchị niile. 
 4 Wetara ohu gị ọṅụ, nʼihi na ọ bụ gị, O Onyenwe m, 
ka m na-eweliri mkpụrụobi m. 
 5 Ị bụ onye na-agbaghara ajọ omume na onye dị mma, O Onyenwe m, 
i jupụtara nʼịhụnanya nye ndị niile na-akpọku gị. 
 6 O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m; 
gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka ebere. 
 7 Nʼụbọchị nsogbu m, aga m akpọku gị, 
nʼihi na ị ga-aza m. 
 8 Nʼetiti chi niile, i nweghị oyiri, O Onyenwe m; 
ọ dịghị ọrụ ebube ọbụla a pụrụ ị sị na ọ dị ka nke ị na-arụ. 
 9 Mba niile i kere ga-abịa nʼihu gị, 
fee gị ofufe, O Onyenwe anyị; 
ha ga-ebutere aha gị ebube. 
 10 Nʼihi na ị dị ukwuu na-arụkwa ọrụ ebube dị iche iche; 
ọ bụ naanị gị bụ Chineke. 
 11 Kuziere m ụzọ gị, O Onyenwe anyị, 
ka m dabere nʼikwesị ntụkwasị obi gị; 
nye m obi na-adịghị agba abụọ, 
ka m nwee ike tụọ egwu aha gị. 
 12 Aga m eji obi m niile too gị, O Onyenwe anyị, na Chineke m; 
aga m ebulikwa aha gị elu ruo mgbe niile ebighị ebi. 
 13 Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu; 
i sitela nʼomimi nke dị ala 
site nʼala ndị nwụrụ anwụ dọpụta m. 
 14 O Chineke, ndị mpako na-emegide m; 
otù ndị mmadụ na-eme ihe ike na-achọ igbu m, 
ha bụ ndị na-ejighị gị kpọrọ ihe ọbụla. 
 15 Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara, 
iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. 
 16 Chee m ihu, mekwaara m amara. 
Nye ohu gị ike gị, 
zọpụtakwa nwa ohu gị nwanyị 
nʼihi na m na-ejere gị ozi. 
 17 Gosi m ihe ịrịbama nke ga-egosipụta ịdị mma gị, 
ka ndị iro m hụ ya si otu a bụrụ ndị ihere ga-eme, 
nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, nyere m aka ma kasịekwa m obi.