Abụ Ọma 83
Abụ, bụ Abụ Ọma Asaf. 
Ekpere maka mmeri 
 1 O! Chineke agbachikwala nkịtị. 
Biko, Chineke, ahapụkwala ikwu okwu, 
anọkwala jụụ. 
 2 Lee na ndị iro gị nọ na-ebigbọ, 
ndị kpọrọ gị asị na-eweli isi ha. 
 3 Ha ji aghụghọ na-agba izu imegide ndị gị; 
ha na-atụ atụmatụ ọjọọ megide ndị ị hụrụ nʼanya. 
 4 Ha na-asị, “Bịanụ ka anyị laa mba a nʼiyi, 
ka a ghara ichetakwa aha Izrel ọzọ.” 
 5 Ha ji otu obi na-agbarịta izu; 
ha agbaala ndụ imegide gị, 
 6 ụlọ ikwu niile nke ndị Edọm, na ndị Ishmel, 
na ndị Moab, na ndị Haga, 
 7 na ndị Gebal, na ndị Amọn, na ndị Amalek, 
na ndị Filistia, ha na ndị Taịa. 
 8 Ọ bụladị ndị Asịrịa esorokwala ha, 
ịgba ndị agbụrụ Lọt ume. 
Sela
  9 Mee ha dịka i si mee ndị Midia, 
na dịka i mere Sisera na Jabin,* 83:9 Eze Jabin na nwa ya Sisera, bụ ndị Debọra meriri nʼagha nʼugwu Taboa. Nkp 4:15-24; 5:20-21. nʼakụkụ iyi Kishọn, 
 10 ndị lara nʼiyi nʼEndoa 
ma ghọọ ihe dịka nsị anụ e kpofuru ekpofu nʼala. 
 11 Mee ka ndị ọgaranya ha dịka Oreb na Zeeb,† 83:11 Ha bụ ndị eze, bụrụkwa ndị ọchịagha ndị Midia. Ha so na ndị Gidiọn meriri nʼagha, Nkp 7:25 
ka ụmụ ndị ikom eze ha niile dịka Zeba na Zalmuna, 
 12 ndị sịrị, “Ka anyị nwetara onwe anyị, 
ebe ịta nri ụmụ anụmanụ niile nke Chineke.” 
 13 O Chineke m, mee ha ka dịka ahịhịa ifufe na-efegharị gburugburu, 
maọbụ dịka igbugbo ọka nʼebe ifufe dị. 
 14 Dịka ọkụ na-erepịa oke ọhịa, 
maọbụ nke na-ere nʼelu ugwu, 
 15 si otu a were oke ifufe chụọ ha ọsọ, 
jiri oke ifufe nke na-eso mmiri ozuzo mee ka ha nọrọ nʼọnọdụ obi ọlụlọ mmiri. 
 16 Were ihere kpuchie ha ihu, 
ka ndị mmadụ si otu a chọọ aha gị, O Onyenwe anyị. 
 17 Ka ha nọdụ nʼọnọdụ ihere na ịda mba mgbe niile; 
ka ha laa nʼiyi nʼọnọdụ mweda nʼala. 
 18 Mee ka ha mata na gị, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, 
na ọ bụ naanị gị bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile. 
*Abụ Ọma 83:9 83:9 Eze Jabin na nwa ya Sisera, bụ ndị Debọra meriri nʼagha nʼugwu Taboa. Nkp 4:15-24; 5:20-21.
†Abụ Ọma 83:11 83:11 Ha bụ ndị eze, bụrụkwa ndị ọchịagha ndị Midia. Ha so na ndị Gidiọn meriri nʼagha, Nkp 7:25