Abụ Ọma 82
Abụ Ọma Asaf. 
Chineke onye ikpe kachasị ndị ikpe 
 1 Chineke na-ewere ọnọdụ ịchị isi nʼetiti ọgbakọ dị ukwuu; 
ọ na-ekpebi ikpe nʼetiti chi niile. 
 2 Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? 
Ruo ole mgbe ka unu ga na-egosi ndị ajọ omume ihuọma? 
Sela
  3 Kperenụ ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị nna ikpe ziri ezi; 
hụnụ na ndị ogbenye na ndị a na-emegbu nwetara ihe ruuru ha. 
 4 Gbapụtanụ ndị na-adịghị ike na ndị nọ na mkpa; 
napụta ha site nʼaka ndị ajọ omume. 
 5 Ha* 82:5 Maọbụ, chi ndị a amaghị ihe ọbụla, ha aghọtaghị ihe ọbụla. 
Ha na-ejegharị nʼọchịchịrị; 
ntọala niile nke ụwa na-ama jijiji. 
 6 “Asịrị m, ‘Unu bụ “chi,” 
unu niile bụ ụmụ ndị ikom nke Onye kachasị ihe niile elu.’ 
 7 Ma unu ga-anwụ ọnwụ dịka mmadụ ndị ọzọ; 
unu ga-ada dịka ndị ọchịchị ọzọ.” 
 8 O Chineke, bilie kpee ụwa ikpe, 
nʼihi na mba niile bụ ihe nketa gị.