Abụ Ọma 75
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala.” Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ. 
Ikpe ikpe ziri ezi nke Chineke 
 1 Anyị na-eto gị, O Chineke. 
Anyị na-eto gị, nʼihi na aha gị dị nso. 
Ndị mmadụ na-ekwu banyere ọrụ ebube gị dị iche iche. 
 2 Ị na-asị, “Ana m ahọpụta oge a kara aka. 
Ọ bụ m na-ekpe ikpe ziri ezi. 
 3 Mgbe ụwa na mmadụ niile bi nʼime ya na-ama jijiji, 
ọ bụ m na-ejidesi ogidi* 75:3 Ya bụ, ntọala ya ike ka o guzo chịm. 
Sela
  4 Nye ndị mpako, ana m asị, ‘Unu etukwala ọnụ ọzọ, 
nye ndị ajọ omume, ana m asị, Unu ewelila mpi† 75:4 Mpi na-anọchite anya ike nʼebe a unu elu. 
 5 Unu ewelila mpi unu megide eluigwe; 
unu ejila nnupu isi kwuo okwu.’ ” 
 6 Ọ dịghị onye ọbụla sitere nʼọwụwa anyanwụ, maọbụ nʼọdịda anyanwụ, 
maọbụ nʼọzara nke pụrụ ibuli mmadụ elu. 
 7 Kama ọ bụ Chineke, onye na-ekpe ikpe; 
ọ na-eweli otu onye elu, wedakwa onye ọzọ ala. 
 8 Otu iko dị nʼaka Onyenwe anyị 
nke jupụtara na mmanya na-agba ụfụfụ nke a gwanyekọtara ụda dị iche iche. 
Ọ na-awụpụ ya, ndị ajọ omume niile nke ụwa 
na-aṅụ ya ruo mgbe ọ gwụsịrị. 
 9 Ma mụ onwe m, aga m ekwupụta nke a ruo mgbe ebighị ebi. 
Aga m abụku Chineke nke Jekọb abụ otuto, 
 10 bụ onye sịrị, “Aga m ebipụ mpi ndị ajọ omume niile, 
ma a ga-ebuli mpi ndị ezi omume elu.”