Abụ Ọma 76
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ. 
Ike mmeri nke Chineke 
 1 A maara Chineke nʼobodo Juda; 
aha ya dị ukwuu nʼobodo Izrel. 
 2 Ụlọ ikwu ya dị na Salem, 
ebe obibi ya dị na Zayọn 
 3 Ebe ahụ ka o tijisịrị àkụ niile na-egbu amụma, 
na ọta niile, na mma agha niile, na ngwa agha niile. 
Sela
  4 Ị jupụtara nʼìhè, 
ị dị oke ebube karịa ọtụtụ ugwu nke anụmanụ jupụtara. 
 5 A pụnarịla ndị nwere obi ike ihe ha, 
ha na-arahụkwa ụra ikpeazụ ha; 
o nweghị otu onye nʼime ndị dike nʼagha ndị a 
pụrụ iweli aka ya abụọ elu. 
 6 Nʼihi ịba mba gị, O Chineke nke Jekọb, 
ịnyịnya na ụgbọ agha na-anọ juu.* 76:6  Ọpụ 15:1-6 
 7 Ọ bụ naanị gị ka e kwesiri ịtụ egwu. 
Onye pụrụ iguzo nʼihu gị mgbe i na-ewe iwe? 
 8 I sitere nʼeluigwe mee ka a nụ olu ikpe ikpe gị. 
Ụwa tụkwara egwu, dere duu, 
 9 mgbe gị, O Chineke, biliri ikpe ikpe, 
ịzọpụta ndị niile a na-akpagbu nʼala a. 
Sela
  10 Nʼezie, oke iwe gị megide ụmụ mmadụ na-ewetara gị otuto,† 76:10  Ọpụ 9:16-18; Rom 9:17 
ndị fọdụrụ mgbe oke iwe gị gabigasịrị, na-anọ juu. 
 11 Kwenụ Onyenwe anyị Chineke nkwa ma mezuokwa ha; 
ka ndị ala niile bụ agbataobi unu 
wetara onye ahụ e kwesiri ịtụ egwu onyinye dị iche iche. 
 12 Ọ na-eweda ndị na-achị achị nʼala; 
ndị eze niile nke ụwa na-atụ ya egwu.