Abụ Ọma 64
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. 
Ekpere maka nchekwa 
 1 Nụrụ olu m O Chineke, mgbe m na-akọsara gị ihe na-esogbu m. 
Chebe ndụ m site nʼaka ndị iro m. 
 2 Zopu m pụọ nʼizu nzuzo niile nke ndị ọjọọ, 
site nʼatụmatụ ndị na-eme ajọ ihe. 
 3 Ha na-amụ ire ha dịka e si amụ mma agha, 
na-agbapụ okwu dịka àkụ ọjọọ. 
 4 Ha na-agba onye na-enweghị ihe o mere àkụ site nʼebe nzuzo, 
na mberede ka ha na-agba ya, na-atụghị egwu. 
 5 Ha na-agbarịta ibe ha ume na-atụmatụ ọjọọ, 
ha na-ekwu banyere isi ọnya ha na nzuzo, 
ha na-asị, “Onye ga-ahụ ya* 64:5 Maọbụ, onye ga-ahụ anyị?” 
 6 Ha na-atụpụta atụmatụ ọjọọ na-asị, 
“Anyị echepụtala atụmatụ zuruoke!” 
Nʼezie, uche na obi mmadụ dị aghụghọ. 
 7 Ma Chineke ga-agba ha àkụ, 
na mberede ka a ga-etida ha. 
 8 Ọ ga-atụgharị okwu ọnụ ha megide ha, 
mee ka ha laa nʼiyi; 
ndị niile hụrụ ha ga-efufe isi ha nʼịkwa emo. 
 9 Mmadụ niile ga-atụ egwu, 
ha ga-ekwupụta ọrụ niile nke Chineke, 
ma tụgharịa uche nke ọma banyere ihe o mere. 
 10 Ndị ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, 
ha ga-agbabakwa nʼime ya; 
ndị niile obi ha ziri ezi ga-anyakwa isi nʼime ya.