Abụ Ọma 63
Abụ Ọma Devid, mgbe ọ nọ nʼọzara Juda. 
Onye ihe Chineke na-agụsị agụụ ike 
 1 O Chineke, ị bụ Chineke m, 
e ji m obi m niile na-achọ gị; 
akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ, 
anụ ahụ m na-achọsi gị ike, 
nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba 
ebe mmiri na-adịghị nʼime ya. 
 2 Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị, 
hụkwa ike gị na ebube gị. 
 3 Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ, 
aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma. 
 4 Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị, 
aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị. 
 5 Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ; 
aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị. 
 6 Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị, 
ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile. 
 7 Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m, 
ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị. 
 8 Mkpụrụobi m na-arapara gị nʼahụ; 
aka nri gị na-ejigide m. 
 9 A ga-ala ndị na-achọ ndụ m nʼiyi; 
ha ga-arịda ruo ebe omimi nke ụwa. 
 10 A ga-eji mma agha laa ha nʼiyi, 
ha ga-abụkwa nri nye nkịta ọhịa. 
 11 Ma eze ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke; 
ndị niile na-eji aha Chineke aṅụ iyi ga-eto ya, 
ma a ga-eme ka ọnụ ndị niile na-agha ụgha dere duu.