Abụ Ọma 51
Abụ dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Mgbe Netan bụ onye amụma bịakwutere Devid nʼoge ya na Batsheba kwara iko. 
Ekpere maka mgbaghara mmehie 
 1 O Chineke, meere m ebere, 
nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; 
nʼihi oke ọmịiko gị, 
hichapụ njehie m niile. 
 2 Sachapụ mmehie m niile,* 51:2  Aịz 43:25; Aịz 44:22; Kọl 2:14. 
ma mee m ka m dị ọcha. 
 3 Nʼihi na amaara m njehie m niile, 
mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile. 
 4 Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, 
mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, 
nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, 
na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe. 
 5 Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m; 
bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m. 
 6 Nʼezie, ị na-achọ eziokwu nʼakụkụ niile zoro ezo; 
ị na-akụziri m amamihe nʼakụkụ niile zoro ezo. 
 7 Were hisọp† 51:7 Nʼoge mmemme idebe ihe ọcha, ọ bụ ahịhịa hisọp ka a na-eji efesa ọbara. sachaa m, aga m adị ọcha; 
sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo. 
 8 Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ; 
ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa. 
 9 Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị, 
hichapụkwa mmehie m niile. 
 10 Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, 
nwogharịa ezi mmụọ nʼime m. 
 11 Achụpụla m nʼihu gị, 
anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị. 
 12 Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị, 
ma jiri ezi mmụọ kwagide m. 
 13 Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị, 
ndị mmehie ga-echegharị lọghachikwute gị. 
 14 O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara, 
Chineke, gị bụ Chineke Onye nzọpụta m, 
ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị. 
 15 O, Onyenwe m, meghee ọnụ m, 
ka m kwupụta otuto gị. 
 16 Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya. 
Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ. 
 17 Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, 
O Chineke, ị naghị elefu anya, 
nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị. 
 18 Ka ọ masị gị inye Zayọn ọganihu; 
i wulie mgbidi niile nke Jerusalem. 
 19 Mgbe ahụ, a ga-enwe ezi aja, 
aja nsure ọkụ nke ga-atọ gị ụtọ; 
mgbe ahụ, a ga-achụkwa aja ọtụtụ oke ehi nʼelu ebe ịchụ aja gị. 
*Abụ Ọma 51:2 51:2 Aịz 43:25; Aịz 44:22; Kọl 2:14.
†Abụ Ọma 51:7 51:7 Nʼoge mmemme idebe ihe ọcha, ọ bụ ahịhịa hisọp ka a na-eji efesa ọbara.