Abụ Ọma 45
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Okoko osisi lili.” Abụ maskil ụmụ Kora. Abụ maka agbamakwụkwọ. 
Abụ ọlụlụ nwunye eze 
 1 Isi okwu dị ebube na-akpali mkpụrụobi m, 
mgbe m na-agụgharị abụ m nye eze; 
ire m bụ mkpisi akwụkwọ dị nʼaka ọka ode akwụkwọ. 
 2 I bụ onye kachasị mma nʼetiti ụmụ mmadụ, 
e ji amara tee egbugbere ọnụ gị mmanụ, 
ebe ọ bụ na Chineke agọziela gị ruo mgbe ebighị ebi. 
 3 Kenye mma agha gị nʼukwu gị, gị onye dị ike; 
yikwasị onwe gị ebube na ịma mma dịka uwe. 
 4 Nʼebube gị, gaa nʼihu nʼime mmeri, 
nʼihi eziokwu, na ịdị obi umeala, na ezi omume; 
ka aka nri gị gosipụta ọrụ gị niile nke na-eju anya. 
 5 Ka àkụ gị niile dị nkọ mapuo mkpụrụobi ndị iro niile nke eze; 
ka mba niile na-adakwa nʼokpuru ụkwụ gị. 
 6 O Chineke, ocheeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, 
mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ 
 7 Ị hụrụ ezi omume nʼanya, ma kpọọ ihe ọjọọ asị; 
ya mere, Chineke, onye bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị, 
site na ite gị mmanụ nke ọṅụ. 
 8 Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ* 45:8 Nke a bụ mmanụ isi ọma a na-efesa nʼuwe. Ọ nọ nʼọnọdụ ihe anyị na-akpọ senti taa. Abk 1:12-13. máá na aloos na akashia; 
ha sitere nʼụlọeze niile, e ji ọdụ enyi chọọ mma. 
Egwu sitere nʼụbọ akwara na-eme ka i nwee obi ụtọ. 
 9 Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ; 
nwunye eze, onye yikwasịrị ọlaedo nke Ọfịa na-eguzo nʼaka nri gị. 
 10 Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu: 
“Chefuo ndị gị na ezinaụlọ nna gị. 
 11 Nʼihi na ịma mma gị ga-eme ka eze chọsie gị ike. 
Sọpụrụ ya nʼihi na ọ bụ onyenwe gị.” 
 12 Ada Taịa† 45:12 Eze mbụ kwụnyeere ọchịchị alaeze Devid bụ eze obodo Taịa, nʼihi Solomọn na eze Taịa nweere ezigbo mmekọrịta dị mma. Taịa bụ isi obodo ebe niile a na-azụ ahịa nʼakụkụ osimiri Mediterenịan. ga-eji onyinye bịa; 
ndị ọgaranya ga-achọkwa ka i gosi ha ihuọma. 
 13 Adaeze, lee ka o si maa mma dị ukwuu nʼime ụlọ ya; 
ọ bụ akwa a kpanyere ọlaedo ka e ji dụọ uwe mwụda ya. 
 14 Ụmụ agbọghọ ibe ya, ndị na-amaghị nwoke, na-eso ya bịakwute gị; 
ọ bụ uwe mwụda a kpanyere ihe ọkpụkpa ka o yi 
mgbe e dubatara ya nʼụlọeze. 
 15 E ji ọṅụ na obi ụtọ dubata ha; 
ha bara nʼime ụlọeze. 
 16 Ụmụ gị ndị ikom ga-anọchi anya nna nna gị; 
ị ga-eme ka ha bụrụ ndịisi nʼala ahụ niile. 
 17 Aga m eme ka echeta ihe banyere gị ruo ọgbọ niile; 
nʼihi nke a, mba niile ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi. 
*Abụ Ọma 45:8 45:8 Nke a bụ mmanụ isi ọma a na-efesa nʼuwe. Ọ nọ nʼọnọdụ ihe anyị na-akpọ senti taa. Abk 1:12-13.
†Abụ Ọma 45:12 45:12 Eze mbụ kwụnyeere ọchịchị alaeze Devid bụ eze obodo Taịa, nʼihi Solomọn na eze Taịa nweere ezigbo mmekọrịta dị mma. Taịa bụ isi obodo ebe niile a na-azụ ahịa nʼakụkụ osimiri Mediterenịan.