Abụ Ọma 46
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Nʼusoro olu abụ alamot. Otu Abụ. 
Chineke bụ ebe mgbaba anyị 
 1 Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị, 
onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu. 
 2 Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi, 
maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri. 
 3 Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ, 
maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. 
Sela
  4 Otu iyi dị nke na-asọbata na-eweta ọṅụ nʼime obodo Chineke, 
nʼime ebe obibi dị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu. 
 5 Chineke bi nʼime ya, ọ gaghị ada; 
Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ. 
 6 Mba niile na-agba aghara, alaeze niile na-adakwa; 
o welitere olu ya elu, ụwa na-agbaze. 
 7  Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị; 
Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. 
Sela
  8 Bịa, hụrụ ihe ebube niile Onyenwe anyị mere, 
lee oke ịla nʼiyi niile o webatara nʼelu ụwa. 
 9 Ọ na-eme ka agha kwụsị 
ruo nsọtụ nke elu ụwa niile. 
Ọ na-agbaji ụta, na-ebibi ùbe, 
ma na-esu ọta* 46:9 Maọbụ, ụgbọ agha agha niile ọkụ. 
 10 Ọ na-asị, “Nọọnụ juu! Maranụ na mụ onwe m bụ Chineke! 
A ga-ebuli m elu nʼetiti mba niile, 
a ga-ebulikwa m elu nʼụwa.” 
 11  Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị; 
Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. 
Sela