Abụ Ọma 32
Abụ Ọma Devid. Abụ Maskil. 
Nkwupụta na mgbaghara mmehie 
 1 Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, 
onye a gbaghaara ajọ omume ya niile, 
onye e kpuchikwaara mmehie ya niile. 
 2 Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ, 
onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya, 
onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya. 
 3 Mgbe m gbachiri nkịtị, 
ọkpụkpụ m rere ure 
site nʼịsụ ude m ogologo ụbọchị niile. 
 4 Ehihie niile na abalị niile, 
ị tara m ahụhụ, 
ume dị m nʼobi gwụchara, 
dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị.* 32:4 Mgbe anwụ na-amịkọrọ mmiri dị nʼala
Sela
  5 Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị, 
kwụsịkwa izo ha ezo. 
Agwara m onwe m okwu sị, 
“Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị.” 
Ị gbaghakwaara m 
ikpe ọmụma nke mmehie m niile. 
Sela
  6 Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere 
mgbe e nwere ike ịchọta gị; 
nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa, 
ọ gaghị erute ha. 
 7 Gị onwe gị bụụrụ m ebe nzuzo; 
Ị ga-echebekwa m ka nsogbu ọbụla hapụ irute m nso. 
Ọ bụkwa abụ nzọpụta ka i ji gbaa m gburugburu. 
Sela
  8 Aga m eme ka ị nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso; 
Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị. 
 9 Adịkwala ka ịnyịnya maọbụ ịnyịnya ibu 
nke na-enweghị akọnuche, 
nke a na-aghaghị iji mkpụmkpụ igwe na eriri kechie ọnụ ya, ijide ya, 
ma emeghị otu a, ọ gaghị abịakwute gị. 
 10 Ọtụtụ ihe mgbu na-abịakwasị ndị na-eme ihe ọjọọ, 
ma ịhụnanya Onyenwe anyị nke na-enweghị ọgwụgwụ, 
na-agba onye ahụ tụkwasịrị ya obi gburugburu. 
 11 Ṅụrianụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nweekwanụ obi ụtọ, unu ndị ezi omume; 
bụọ abụ, unu ndị obi ha ziri ezi.