Abụ Ọma 33
Ịdị mma na ịdị ukwuu Onyenwe anyị 
 1 Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume; 
nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya. 
 2 Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị; 
werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu. 
 3 Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ; 
were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ. 
 4 Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu; 
o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile. 
 5  Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya; 
ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ. 
 6 Ọ bụ site nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị ka e ji kee eluigwe niile, 
jirikwa nkuume nke ọnụ ya mee anwụ, na ọnwa na kpakpando niile. 
 7 Ọ bụ ya kekwara osimiri niile chịkọta ha nʼotu ebe, 
kpaa oke ebe ha ga-anọ dịka ụlọakụ dị ukwuu. 
 8 Ka ụwa niile tụọ Onyenwe anyị egwu; 
ka mmadụ niile bi nʼụwa sọpụrụ ya. 
 9 Nʼihi na o kwuru okwu, okwu ahụ mezukwara; 
o nyere iwu, iwu ahụ guzokwara chịm. 
 10  Onyenwe anyị na-emebi atụmatụ mba niile; 
ọ na-emebi ebumnobi ụmụ mmadụ. 
 11 Atụmatụ Onyenwe anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, 
ebumnobi ya ruo ọgbọ niile. 
 12 Mba a gọziri agọzi ka mba ahụ bụ, bụ ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha; 
bụ ndị ọ họpụtara ka ha bụrụ ihe nketa ya. 
 13  Onyenwe anyị si nʼeluigwe na-ele ndị mmadụ bi nʼụwa anya. 
Ọ na-ahụzu ụmụ mmadụ niile anya. 
 14 O sitere nʼebe obibi ya na-ele 
onye ọbụla bi nʼelu ụwa anya. 
 15 Ebe ọ bụ ya kpụrụ obi mmadụ niile nʼotu na otu; 
ọ na-ahụzu, na-amazukwa ihe niile ha na-eme. 
 16 Ọnụọgụgụ ndị agha eze apụghị ịzọpụta ya; 
o nweghị onye agha ọbụla na-azọpụta onwe ya, site nʼịdị ukwuu nke ike ya. 
 17 Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha. 
Ọ bụ ezie na ịnyịnya dị ike, ma ha apụghị ịzọpụta ndị nwe ha. 
 18 Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche, 
ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ. 
 19 Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ. 
Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ. 
 20 Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị; 
ọ bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị. 
 21 Obi anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime ya; 
nʼihi na anyị tụkwasịrị aha nsọ ya obi. 
 22 O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị na-adịgidere anyị, 
dịka olileanya anyị dị na gị.