Abụ Ọma 24
Abụ Ọma Devid. 
Eze onyenwe ebube 
 1 Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị; 
ụwa na ndị niile bi nʼime ya. 
 2 Ọ tọrọ ntọala ya nʼime oke osimiri niile, 
o mekwara ka o guzosie ike. 
 3 Onye bụ onye ahụ nwere ike irigo nʼelu ugwu Onyenwe anyị? 
Onye nwere ike ịbata guzo nʼime ụlọnsọ ya? 
 4 Ọ bụ onye aka ya emeghị ihe ọjọọ, obi ya dịkwa ọcha, 
onye na-adịghị atụkwasị obi na chi arụsị, 
maọbụ ṅụọ iyi aghụghọ. 
 5 Ha ga-anata ngọzị site nʼaka Onyenwe anyị, 
natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha. 
 6 Otu a ka ọ ga-adịrị ọgbọ ndị ya, 
bụ ndị na-achọ ihu gị, Chineke nke Jekọb. 
Sela
  7 Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, 
meenụ ka isi unu bụrụ ihe e welitere, unu ọnụ ụzọ ama ochie, 
ka eze ebube nwee ike ịbata. 
 8 Onye bụ eze ebube* 24:8  Mkp 19:11-16 a? 
Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dimkpa na dike. 
Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dike nʼagha. 
 9 Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, 
buliekwanụ ha elu, unu ọnụ ụzọ ama ochie, 
ka Eze ebube nwee ike ịbatakwa. 
 10 Onye bụ eze ebube a? 
Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, 
ọ bụ ya bụ Eze ebube! 
Sela