Abụ Ọma 25
Abụ Ọma Devid. 
Ekpere maka odudu na nnapụta 
 1 Ọ bụ na gị Onyenwe anyị 
ka m tụkwasịrị obi m. 
 2 O Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi m. 
Ekwela ka ihere mee m, 
ekwekwala ka ndị iro m merie m. 
 3 Ihere agaghị eme 
onye ọbụla olileanya ya dị na gị, 
ma ihere ga-eme ha 
bụ ndị niile ịghọ aghụghọ jụrụ ahụ. 
 4 O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile, 
kuzikwaara m ụzọ gị niile. 
 5 Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, 
nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, 
olileanya m dị na gị. 
 6 Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị, 
nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie. 
 7 Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m, 
ya na nnupu isi m niile. 
Kama site nʼịhụnanya gị cheta m, 
Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ. 
 8 Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ; 
ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya. 
 9 Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi, 
na-ezikwa ha ụzọ nke ya. 
 10 Ụzọ niile nke Onyenwe anyị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, 
nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya. 
 11 Nʼihi aha gị, O Onyenwe anyị, 
gbaghara m ajọ omume m nʼagbanyeghị na ha dị ukwuu. 
 12 Olee mmadụ ahụ nke na-atụ egwu Onyenwe anyị? 
O ga-ezi ya ihe nʼụzọ ahụ a họpụtaara ya. 
 13 Ọ ga-ebi ogologo ụbọchị nke ndụ ya nʼime ịba ụba, 
ndị agbụrụ ha ga-eketa ala ahụ. 
 14  Onyenwe anyị na-eme ka ndị ahụ na-atụ egwu ya mara 
ọgbụgba ndụ ya na izu nzuzo ya. 
 15 Anya m abụọ na-elegide Onyenwe anyị mgbe niile; 
nʼihi na ọ bụ naanị ya ga-eme ka ụkwụ m abụọ site nʼọnya pụta. 
 16 Chee m ihu ma gosi m ebere gị, 
nʼihi na abụ m onye nọ na nsogbu, naanị m nọkwa. 
 17 Ihe mgbu nke obi m abaala ụba, 
napụta m site nʼobi mwute. 
 18 Lekwasị nsogbu m na ihe mgbu m anya. 
Biko, gbaghara m mmehie m niile. 
 19 Lee ka ndị iro m si mụbaa, 
ha ji oke iwe kpọọ m asị. 
 20 Chebe ndụ m ma gbapụta m; 
ekwela ka m bụrụ onye ihere ga-eme, 
nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ 
 21 Kwere ka ezi omume na izuoke bụrụ ihe ga-agba m gburugburu, 
nʼihi na olileanya m dị nʼime gị. 
 22 O Chineke, Gbapụtakwa Izrel, 
site na nsogbu ya niile.