Abụ Ọma 23
Abụ Ọma Devid. 
Onyenwe anyị na-azụ anyị dị ka atụrụ 
 1  Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m. 
 2 Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto, 
ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ, 
 3 ọ na-atụte mkpụrụobi m. 
Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume 
nʼihi aha ya. 
 4 A sịkwarị na m na-aga ije, 
na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ, 
agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla; 
nʼihi na ị nọnyeere m, 
mkpọrọ gị na mkpanaka gị 
na-akasị m obi. 
nʼanya ndị iro m. 
iko m na-ejubiga oke. 
 6 Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m 
ogologo ụbọchị niile nke ndụ m, 
m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị 
mgbe niile ebighị ebi. 
*Abụ Ọma 23:5 23:5 Nʼoge ochie, ọ bụ nʼebe iri nri (tebul) ka enyi na enyi na-anọ agba ndụ, maọbụ nwe nkwekọrịta. Oriri a na-egosi na ọgbụgba ndụ bụ ihe ọṅụ na ezi mmekọrịta nke enyi na enyi. Eze ahụ nke na-azụ ndị ya dịka atụrụ, nabatara ohu ya bụ Devid nʼebe iri nri, dịka e dere ya nʼabụ ọma a.
†Abụ Ọma 23:5 23:5 Mmanụ a na-ete nʼisi na-esi isi ụtọ, ọ bụ mmanụ a na-ete onye a kporo oriri iji kwanyere ya ugwu. Luk 7:46 Ndị ọzụzụ atụrụ na-ejikwa ya achụ ụmụ ahụhụ na ndanda na-achọ ịrịbanye atụrụ ndị ha na-azụ nʼimi.