Abụ Ọma 22
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ nke “Nne ele nke ụtụtụ.” Abụ Ọma Devid. 
Akwa na abụ ekele 
 1 Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m? 
Gịnị mere i ji nọ ebe dị anya ịzọpụta m, 
nʼebe dị anya site nʼịsụ ude m niile? 
 2 O Chineke m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m, 
nʼabalị kwa, ma ọ dịghị izuike m nwere.* 22:2 Maọbụ, Nʼabalị, adịghị m emechikwa ọnụ m 
 3 Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ; 
ị bụ otuto ndị Izrel. 
 4 Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi; 
ha tụkwasịrị gị obi, ị zọpụtakwara ha. 
 5 Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara; 
ihere emeghị ha nʼihi na ha tụkwasịrị gị obi. 
 6 Abụ m idide, abụghị m mmadụ; 
onye ndị ọzọ na-akwa emo, onye ndị mmadụ na-eleda anya. 
 7 Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị; 
na-emiri m ọnụ ịkwa emo, na-efufekwa isi ha na-asị. 
 8 “O na-atụkwasị Onyenwe anyị obi; 
ka Onyenwe anyị bịa gbapụta ya. 
Ya napụta ya ebe ọ bụ 
na ihe ya masịrị ya.” 
 9 Ma Onyenwe anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m. 
Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara. 
 10 Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị. 
Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m. 
 11 Anọla m ebe dị anya, 
nʼihi na nsogbu dị nso. 
Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso. 
 12 Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu; 
oke ehi dị ike nke Bashan† 22:12 Bashan bụ obodo e ji oke ehi gbara abụba ma dịkwa ike maara. Ọ dị na mpaghara ugwu nʼọwụwa anyanwụ ala Filistia. Dit 3:1; Ems 4:1 gbara m gburugburu. 
 13 Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa 
asaghepụla ọnụ ha megide m. 
 14 A wụpụla m dịka mmiri, 
ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha. 
Obi m agbazela dịka mmanụ, 
obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m. 
 15 Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime. 
Ire m na-araparakwa m nʼọnụ, 
nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ. 
 16 Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu; 
otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu, 
ha adupuola m aka m na ụkwụ m. 
 17 A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ; 
ndị mmadụ na-ele m anya na-emikwa ọnụ ọchị 
 18 Ha na-eke uwe m nʼetiti ha, 
ha sitere nʼife nza kee uwe m. 
 19 Ma gị, Onyenwe anyị, anọla m ebe dị anya; 
gị Onye bụ ike m, mee ngwangwa bịa nyere m aka. 
 20 Napụta ndụ m site na mma agha, 
site nʼike ụmụ nkịta, napụta ndụ m nke dị oke ọnụahịa. 
 21 Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a, 
zọpụta m site na mpi atụ ndị a. 
 22 Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m; 
nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto. 
 23 Toonu Onyenwe anyị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya; 
unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya! 
Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel! 
 24 Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya 
maọbụ kwaa ya emo; 
o lefughị ya anya 
kama mgbe ọ kpọkuru ya, ọ nụrụ olu akwa ya. 
 25 Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị; 
aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị. 
 26 Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha, 
ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ga-eto ya 
ka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. 
 27 Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta, 
ma laghachikwute Onyenwe anyị. 
Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche 
ga-akpọ isiala nʼihu ya. 
 28 Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị, 
ọ na-achịkwa mba niile. 
 29 Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya; 
ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya; 
ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ. 
 30 Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi; 
a ga-akọrọ ọgbọ ndị na-abịa nʼihu ihe banyere onyenwe anyị. 
 31 Ha ga-ekwusa ezi omume ya 
nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu, bụ ndị a na-amụbeghị 
nʼihi na o meela ya. 
*Abụ Ọma 22:2 22:2 Maọbụ, Nʼabalị, adịghị m emechikwa ọnụ m
†Abụ Ọma 22:12 22:12 Bashan bụ obodo e ji oke ehi gbara abụba ma dịkwa ike maara. Ọ dị na mpaghara ugwu nʼọwụwa anyanwụ ala Filistia. Dit 3:1; Ems 4:1