Abụ Ọma 18
Abụ ọma Devid. Abụ Devid ohu Onyenwe anyị. Ọ bụụrụ Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. Ọ sịrị: 
Abụ mmeri 
 1 O Onyenwe anyị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m. 
 2  Onyenwe anyị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. 
Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. 
Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya. 
 3 Akpọkuru m Onyenwe anyị, onye e kwesiri inye otuto, 
ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m. 
 4 Ụdọ niile nke ọnwụ kere m agbụ; 
ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m. 
 5 Ụdọ nke ili kere m gburugburu, 
ọnya nke ọnwụ guzogidere m. 
 6 Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị; 
etiri m mkpu akwa, kpọkuo Chineke m ka o nyere m aka; 
akwa m rutekwara ya ntị, 
o sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m. 
 7 Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji, 
ntọala niile nke ugwu niile makwara jijiji, 
ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya. 
 8 Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta, 
ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta; 
icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta. 
 9 O kewara mbara eluigwe, rịdata; 
oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya. 
 10 Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim* 18:10 Cherubim bụ mmụọ ndị ahụ dị ike na ndị jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ. Ọrụ ha bụ ibu ocheeze Ebube ahụ. Izk 1:26 felie elu, 
o feliri elu nʼelu nku nke ifufe. 
 11 O mere ọchịchịrị ebe nzuzo ya, ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu, 
bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe. 
 12 Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, igwe ojii 
ji mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe gabiga. 
 13  Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ; 
olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda. 
 14 Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa, 
o jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha. 
 15 E kpughere ala ala nke oke osimiri, 
gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ, 
site nʼịba mba gị, O Onyenwe anyị, 
na nkuume si gị nʼimi pụta. 
 16 O sitere nʼelu setịpụ aka ya, 
jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile. 
 17 Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike, 
bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m. 
 18 Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m, 
ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere. 
 19 Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara, 
ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ. 
 20  Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị; 
ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị. 
 21 Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị, 
ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ. 
 22 Iwu ya niile dị nʼihu m, 
esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m. 
 23 Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya, 
edebekwara m onwe m pụọ na mmehie. 
 24  Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị, 
dịka ịdị ọcha nke aka m abụọ si dị nʼanya ya. 
 25 Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, 
nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke. 
 26 Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha, 
ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ. 
 27 Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, 
ma ị na-eme ka ndị nwere anya mpako dị ala. 
 28 Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, na-eme ka oriọna m na-enwu, 
Chineke m na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè. 
 29 Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ, 
sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla. 
 30 Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke, 
okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha; 
ọ bụ ọta† 18:30 Ya bụ, ebe nchebe nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya. 
 31 Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? 
Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị? 
 32 Ọ bụ Chineke na-enye m ike, 
na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke. 
 33 Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele; 
Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu. 
 34 Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha, 
ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz. 
 35 Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m, 
aka nri gị na-akwagidekwa m, 
inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu. 
 36 Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ, 
ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ. 
 37 Achụrụ m ndị iro m ọsọ, jidekwa ha; 
alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi. 
 38 Etidara m ha nʼala ebe ha enwekwaghị ike ibilite. 
Ha dara nʼokpuru ụkwụ m. 
 39 Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha, 
i wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m. 
 40 I mere ka ndị iro m tụgharịa gbapụ ọsọ. 
Ebibikwara m ndị kpọrọ m asị. 
 41 Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha. 
Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha. 
 42 Egwepịara m ha nke ọma dịka ntụ nke ikuku na-ebufu; 
a zọtọrọ m ha dịka apịtị nke okporoụzọ. 
 43 Ị napụtala m site nʼaka ndị na-alụso m ọgụ 
ị meela m onyeisi nke ọtụtụ mba; 
ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi. 
 44 Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu, 
ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m. 
 45 Obi na-ada ha mba; 
ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta. 
 46  Onyenwe anyị na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m! 
Mbuli elu dịrị Chineke, Onye nzọpụta m. 
 47 Ọ bụ Chineke ahụ onye na-abọrọ m ọbọ, 
onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m, 
 48 onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m. 
I mere ka m dị elu karịa ndị iro, 
napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike. 
 49 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche, 
aga m abụku aha gị abụ otuto. 
 50 Ọ na-enye eze ya mmeri dị ukwuu; 
Ọ na-egosikwa onye ya onye e tere mmanụ ịhụnanya na-adịghị ada ada, 
nye Devid na ndị agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi. 
*Abụ Ọma 18:10 18:10 Cherubim bụ mmụọ ndị ahụ dị ike na ndị jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ. Ọrụ ha bụ ibu ocheeze Ebube ahụ. Izk 1:26
†Abụ Ọma 18:30 18:30 Ya bụ, ebe nchebe