Abụ Ọma 19
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. 
Akaọrụ Chineke na iwu ya 
 1 Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke; 
mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya. 
 2 Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu, 
ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma. 
 3 Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu, 
ma a na-anụ ụda ha. 
 4 Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo, 
okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ. 
Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ. 
 5 Ọ dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta, 
dịka ọgba ọsọ nke ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi. 
 6 Ọ na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe, 
bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ. 
Ọ dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya. 
 7 Iwu Onyenwe anyị zuruoke; 
ọ na-eweghachi mkpụrụobi. 
Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi; 
ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. 
 8 Iwu Onyenwe anyị ziri ezi, 
ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ. 
Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke, 
ọ na-enye anya ìhè. 
 9 Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha, 
ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; 
ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike, 
ha niile bụkwa ihe ziri ezi. 
 10 Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo, 
karịa ọlaedo a nụchara anụcha; 
ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ, 
karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ. 
 11 Ọ bụ site na ha ka a na-adọ ohu gị aka na ntị; 
ụgwọ ọrụ dị ukwuu dị nʼidebe ha. 
 12 Onye pụrụ ịghọta amaghị ama ya niile? 
Gbaghara m ihe niile zoro ezo nke adịghị ike m. 
 13 Chebe m, ka m ghara ilezi anya mehie megide gị. 
Ekwela ka ha na-achị achị na ndụ m. 
Mgbe ahụ ka m ga-abụ onye zuruoke, 
onye nwere onwe ya site nʼebe ihe ọjọọ niile nke mmehie dị. 
 14 Kwere Onyenwe anyị, Onye mgbapụta m, na Oke nkume nchebe m, 
ka okwu ọnụ m niile, na echiche obi m niile, 
bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, na nke ị na-anabata.