5
Abụ akwa na ịkpọ oku maka nchegharị 
 1 Nụrụnụ okwu ndị a, nke a ka m na-ekwu megide unu, ọ bụ mkpu akwa maka gị ezinaụlọ nke Izrel: 
 2 “Izrel, nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, a daala, 
ọ gaghị ebilite ọzọ, 
onye a gbahapụrụ nʼala nke aka ya, 
ọ dịkwaghị onye ga-ekulite ya.” 
 3 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-asị Izrel, 
“Obodo unu nke na-ezipụ puku ndị ike, 
ka naanị narị ga-afọdụ, 
obodo unu na-ezipụ narị ndị ike 
ka naanị iri ga-afọdụrụ.” 
Chọsienụ Chineke ike ka unu dị ndụ 
 4 Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị na-agwa ụlọ Izrel, 
“Chọọnụ m, ka unu dịrị ndụ. 
 5 Unu achọla Betel, 
unu abanyekwala na Gilgal, 
maọbụ ga ije ruo Bịasheba. 
Nʼihi na Gilgal aghaghị ije biri nʼala ọzọ, 
ebe Betel ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu.”* 5:5 Maọbụ, ajọ ihe 
 6 Chọọnụ Onyenwe anyị, ka unu dịrị ndụ, 
ka ọ gharakwa iji ike bịakwasị ụlọ Josef, dịka ire ọkụ, 
ọ ga-erepịa ha. 
Betel agaghị enwe onye ga-emenyụ. 
 7 Unu ndị na-eme ikpe ziri ezi ka ọ ghọọ ihe ilu, 
na-ekpukwa ezi omume ihu nʼala. 
 8 Onye mere kpakpando pleiades na orion, 
onye na-emekwa ka oke ọchịchịrị ghọọ ụtụtụ, 
na-emekwa ka ụbọchị ghọọ abalị, 
onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku, 
wụsa ha nʼelu ala akọrọ, 
Onyenwe anyị bụ aha ya. 
 9 Onye na-eme ka ịla nʼiyi bịakwasị ndị dị ike nʼotu ntabi anya, 
na-emekwa ka ịla nʼiyi bịakwasị ebe ahụ niile e wusiri ike. 
 10 Ọ dị ndị na-akpọ onye na-edebe ikpe ziri ezi nʼụlọikpe asị, 
na-elelịkwa onye na-ekwu eziokwu anya. 
 11 Unu na-azọpịa ndị ogbenye, 
na-anapụ ha ukwu ọka wiiti ha. 
Unu ewuolara onwe unu ụlọ nkume a wara awa, 
ma unu agaghị ebi nʼime ha. 
Unu akụọla ubi vaịnị mara mma, 
ma unu agaghị aṅụ ihe ọṅụṅụ ọbụla sitere nʼime ha. 
 12 Nʼihi na amaara m njehie unu niile, ka ha si baa ụba, 
matakwa ọtụtụ mmehie unu niile. 
Unu na-emegbu ndị ezi omume, na-erikwa ngarị. 
Ma na-achụpụkwa ndị ọ dịghị nke ha nwere nʼọnụ ụzọ ama. 
 13 Nʼihi ya, onye nwere uche na-ekpuchi ọnụ ya nʼoge ahụ, 
nʼihi na oge ndị ahụ dị njọ. 
 14 Chọsienụ ezi ihe ike, ọ bụghị ihe ọjọọ; 
ka unu dịrị ndụ. 
Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọnyere unu, 
dịka unu si kwuo. 
 15 Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, ma hụnụ ezi ihe nʼanya. 
Meenụ ka ikpe ziri ezi guzosie ike nʼụlọikpe unu. 
O nwere ike bụrụ na Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile 
ga-enwe amara nʼahụ ndị fọdụụrụ Josef. 
 16 Nʼihi ya, nke a ka Onyenwe anyị, Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Onyenwe anyị na-asị, 
“Oke iti mkpu akwa aghaghị ịdị nʼokporoụzọ niile; 
ọ bụkwa nʼama niile ka ha ga-asị, azịgbakwa, azịgbakwa. 
A ga-akpọ ndị ọrụ ubi ka ha bịa kwaa akwa, 
kpọọkwa ndị na-eru ụjụ ka ha bịa tie mkpu akwa. 
 17 A ga-enwe iti mkpu akwa nʼime ubi vaịnị niile, 
nʼihi na aga m esi nʼetiti unu gafee,” 
ka Onyenwe anyị kwuru. 
Ụbọchị Onyenwe anyị 
 18 Ahụhụ dịrị unu,† 5:18 Maọbụ, Azịgba unu 
ndị ahụ na-achọsi ụbọchị Onyenwe anyị ike. 
Gịnị mere unu ji achọ ụbọchị nke Onyenwe anyị ahụ? 
Ụbọchị ahụ ga-abụ ọchịchịrị, ọ bụghị ìhè. 
 19 Ọ ga-adị ka onye si nʼihu ọdụm na-agbapụ 
ma zute anụ ọhịa bịa, 
maọbụ onye gbabara nʼụlọ ya izuike 
ma tụkwasị aka ya nʼaja ụlọ, 
agwọ ataa ya. 
 20 Ụbọchị Onyenwe anyị ọ gaghị abụ ụbọchị ọchịchịrị, na-abụghị ìhè, 
nke oke ọchịchịrị, a na-agaghị enwe ìhè ọbụla na ya? 
 21 “Akpọrọ m mmemme oriri na ọṅụṅụ unu asị, ajụla m ya. 
Nnọkọ nke oke nzukọ unu adịghị atọkwa m ụtọ. 
 22 A sịkwarị na unu bunyere m aja nsure ọkụ unu na aja mkpụrụ ọka unu, 
agaghị m anabata ha. 
Aja udo nke anụ unu gbara abụba 
abụrụghị m ihe ọbụla. 
 23 Sitenụ nʼebe m nọ wezuga ụzụ ịbụ abụ unu. 
Agaghị m ege ntị nʼabụ ụbọ akwara unu. 
 24 Kama meenụ ka ikpe ziri ezi na-asọgharị dịka mmiri, 
ka ezi omume na-asọgharịbiga oke dịka iyi nke na-adịghị ata ata. 
 25 “Iri afọ anọ ndị ahụ unu nọ nʼọzara, 
unu chụụrụ m aja, unu o wetara m onyinye, unu ụlọ Izrel? 
 26 Unu ga-ebuli eze unu Sakut elu, 
na arụsị Kayiwan, chi kpakpando unu, 
bụ onyinyo unu, na chi niile a kpụrụ akpụ, 
nke unu kpụrụ nye onwe unu. 
 27 Ya mere, aghaghị m ime ka e buru unu gaa nʼala ndị ọzọ, nʼofe Damaskọs,” 
ka Onyenwe anyị, Onye ahụ aha ya bụ Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.