4
Izrel alọghachibeghị nʼebe Chineke nọ 
 1 Nụrụ okwu a, unu nne ehi nke Bashan, ndị na-ebi nʼelu ugwu Sameria, 
unu ndị inyom na-emegbu ndị ogbenye, ma zọpịakwa ndị mkpa na-akpa, 
ndị na-asị di ha, “welatara anyị ihe ọṅụṅụ” 
 2 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela ịdị nsọ ya ṅụọ iyi, sị, 
“Ụbọchị ahụ aghaghị ịbịa 
mgbe a ga-eji nko dọkpụrụ unu pụọ; 
jiri nko azụ dọkpụrụ ọ bụladị onye ikpeazụ nʼime unu. 
 3 Ọ bụ site nʼoghere dị iche iche e mere na mgbidi obodo, 
ka onye ọbụla ga-esi nʼahịrị nʼahịrị pụọ, 
a ga-atụga unu nʼụzọ Hamon.” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 
 4 “Gaanụ na Betel, ma jehie. 
Jeenụ Gilgal mee ka mmehie baa ụba. 
Butenụ ihe aja unu ụtụtụ niile. 
Webatakwanụ onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri unu nʼụbọchị atọ* 4:4 Maọbụ, nʼafọ atọ ọbụla. 
 5 Chụọnụ aja nsure ọkụ dịka aja ekele, site nʼachịcha koro eko; 
kpọsaakwanụ banyere onyinye afọ ofufu niile unu na-enye, 
nyaanụ isi banyere ha, unu bụ ndị Izrel, 
nʼihi na nke a bụ ihe unu hụrụ nʼanya ime.” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 
 6 “E mere m ka unu nwee eze dị ọcha† 4:6 Eze ha dị ọcha nʼihi erighị nri ọbụla nʼobodo unu niile, 
mekwa ka ụkọ nri dị nʼọnụmara unu niile 
ma unu alọghachikwuteghị m.” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 
 7 “Ọzọkwa, Mụ onwe m gbochikwara‡ 4:7 Maọbụ, kwụsịkwara mmiri izoro unu, 
mgbe ọ fọdụrụ ọnwa atọ tupu owuwe ihe ubi ebido. 
Enyere m otu obodo mmiri ozuzo, 
ma gbochie ya izoro obodo nke ọzọ. 
Mmiri zoro nʼotu ubi, 
ma nke mmiri ezoghị na ya kpọnwụrụ. 
 8 Ndị si obodo abụọ maọbụ atọ chọrọ mmiri ọṅụṅụ jee nʼobodo ọzọ, 
ma ha enwetaghị nke ha ji aṅụju afọ, 
ma nʼime ihe ndị a niile unu alọghachikwuteghị m.” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 
 9 “Ezitere m ọrịa nchakpọ nʼubi unu niile a gbara ogige, ya na ubi vaịnị unu niile, ọtụtụ oge, 
werekwa ọrịa na-eripịa ihe ubi na ọmụma ebu bibie ha, 
zitekwa igurube nke richapụrụ osisi fiig na osisi oliv unu niile, 
ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 
 10 “Ezitere m nʼetiti unu ajọ ọrịa na-efe efe 
dịka ndị ahụ m zitere ndị Ijipt. 
Ejiri m mma agha gbuo ụmụ okorobịa unu, 
mee ka a dọta ịnyịnya agha unu nʼagha. 
Emere m ka isisi ọjọọ ndị niile nwuru nʼọmụma ụlọ ikwu§ 4:10 Maọbụ, ebe obibi unu jupụta imi unu, 
ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 
 11 “Akwaturu m ụfọdụ nʼime unu 
dịka mgbe Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra. 
Unu dịka ọlọkọ nkụ ọkụ alọpụtara site nʼọkụ, 
ma unu alọghachikwuteghị m,” 
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 
 12 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka m na-aga ime gị, gị bụ Izrel. 
Ebe ọ bụkwa na ejikerela m ime gị ihe ndị a, 
jikere, O Izrel, izute Chineke gị.” 
 13 Ma lee, onye na-akpụ ugwu niile, 
onye na-ekekwa ifufe, 
nke na-ekpughekwa echiche uche ya nye mmadụ, 
onye na-emekwa ka chi ọbụbọ* 4:13 Ya bụ, ụtụtụ ghọọ ọchịchịrị, 
na-azọchakwa ugwu niile nʼọbụụkwụ ya, 
Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.