3
Ndị ama megide Izrel 
 1 Nụrụnụ okwu ndị a nke Onyenwe anyị kwuru megide unu, unu ndị Izrel, megidekwa ezinaụlọ ahụ niile nke m kpọpụtara site nʼala Ijipt. 
 2 “Naanị unu ka m họọrọ 
nʼime ezinaụlọ niile nke nọ nʼelu ụwa; 
Ọ bụ nʼihi nke a ka m ga-eji nye unu ahụhụ 
nʼihi mmehie unu niile.” 
 3 Mmadụ abụọ ga-esi aṅaa jekọọ ije 
ma ọ bụrụ na ha enweghị nkwekọrịta? 
 4 Ọdụm ọ na-agbọ ụja nʼọhịa 
ma ọ bụrụ na o nweghị anụ ọ hụrụ? 
Nwa ọdụm ọ na-ebigbọ nʼime olulu ya, 
mgbe ọ dịghị anụ ọ dọgburu? 
 5 Nnụnụ ọ na-ama nʼọnya dị nʼala 
ma ọ bụrụ na o nweghị ọnya e siri ijide ya? 
Ọnya e siiri anụ ọ na-akụchi 
ma ọ bụrụ na o nweghị ihe ọ matara? 
 6 Mgbe a fụrụ opi nʼobodo, 
ọ bụ na ndị bi nʼime ya adịghị ama jijiji? 
Mgbe mbibi na ịla nʼiyi dakwasịrị obodo ọbụla 
ọ bụghị Onyenwe anyị mere ka ọ dị? 
 7 Nʼezie Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị adịghị eme ihe ọbụla 
tutu ruo mgbe o buru ụzọ gosi ya 
ndị na-ejere ya ozi bụ ndị amụma. 
 8 Ọdụm agbọọla ụja, 
o nwere onye na-agaghị atụ egwu? 
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ekwuola okwu, 
onye ga-ahapụ ibu amụma? 
 9 Kwusaanụ ya nʼobodo niile e wusiri ike nke Ashdọd 
na ebe niile e wusiri ike nke Ijipt, sị, 
“Zukọtanụ* 3:9 Maọbụ, Werenụ ọnọdụ unu nʼelu ugwu niile nke Sameria 
ka unu hụ oke ọgbaaghara nke dị nʼetiti ya 
na mmegbu niile nke dị nʼetiti ndị ya.† 3:9 A na-eme nʼime ya” 
 10 “Ha echezọọla ime ezi ihe.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, 
“bụ ndị ahụ na-akpakọba ihe e zutere nʼohi na ihe e sitere nʼaka ike pụnara ndị mmadụ 
nʼime nʼụlọ ha niile e wusiri ike.” 
 11 Nʼihi ya nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, 
“Onye iro na-abịa! Ọ ga-agba ala gị gburugburu; 
ọ ga-akwatu ebe niile gị bụ nke e wusiri ike, 
ma kwakọrọkwa ihe niile dị nʼụlọ gị ndị ahụ e wusiri ike.” 
 12 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, 
“Dịka onye ọzụzụ atụrụ si anapụta 
naanị ọkpụkpụ ụkwụ abụọ maọbụ iberibe ntị site nʼọnụ ọdụm, 
otu a ka a ga-esi zọpụta ụmụ Izrel bi na Sameria, 
na nkuku isi ihe ndina‡ 3:12 Ndị na-edina nʼelu akwa dara oke ọnụahịa 
na nʼiberibe akwa ọma site nʼelu ihe ndina.§ 3:12 Ọ bụ nʼọnụ akụkụ ihe ndina na akwa ha” 
 13 “Nụrụ nke a, ma gbaanụ ama megide ụmụ Jekọb,” ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri. 
 14 “Nʼụbọchị ahụ, m ga-enye Izrel ahụhụ nʼihi mmehie ha, 
aghaghị m imebikwa ebe ịchụ aja nke dị na Betel. 
Mpi dị nʼebe ịchụ aja ka a ga-ebipụkwa, 
mee ka ha daa nʼala. 
 15 Aga m etida ụlọ ndị niile ha wuru maka oge oyi, 
na nke ha wuru maka oge okpomọkụ; 
aga m ebibikwa ụlọ ndị ahụ niile ha ji ọdụ enyi wuo. 
Ọtụtụ ebe obibi ha niile ka a ga-etitukwa.” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.