Abụ Ọma 116
Chineke na-anapụta 
 1 Ahụrụ m Onyenwe anyị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m; 
ọ nụrụ mkpu akwa m maka ebere. 
 2 Nʼihi na o gere m ntị, 
aga m akpọku ya oge ndụ m niile. 
 3 Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m, 
oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m; 
nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m. 
 4 Mgbe ahụ, akpọkuru m aha Onyenwe anyị: 
“O Onyenwe anyị, zọpụta m!” 
 5  Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume. 
Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko. 
 6  Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche; 
mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m. 
 7 Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m, 
nʼihi na Onyenwe anyị emesola gị mmeso ọma. 
 8 Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ, 
anya m site na anya mmiri akwa, 
napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ, 
 9 ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyị 
nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi. 
 10 Ekwenyere m na Onyenwe anyị mgbe m kwuru sị, 
“Abụ m onye nọ nʼoke nsogbu,” 
 11 nʼime ịda mba m, ekwuru m sị, 
“Mmadụ niile bụ ndị ụgha.” 
 12 Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyị 
nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m? 
 13 Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu 
kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. 
 14 Nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ 
mezuo nkwa m kwere Onyenwe anyị. 
 15 Ọnwụ nke ndị nsọ ya 
dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị. 
 16 O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị; 
abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị; 
ị zọpụtala m site na agbụ e kere m. 
 17 Aga m achụrụ gị aja ekele 
kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. 
 18 Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile 
ka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere, 
 19 nʼime ogige ụlọ Onyenwe anyị, 
nʼetiti gị, O Jerusalem. 
Toonu Onyenwe anyị.